Jeremaya 48:36
Jeremiah 48:36 · Biblica® Open Igbo Contemporary Bible 2020
“Ụda akwa nke na-ada nʼime obi m nʼihi Moab dịka ụda ọja. Ụda akwa nke dịkwa ka ụda ọja na-adakwa nʼime obi m nʼihi ndị Kia Hareset. Akụ niile ha kpakọtara alaala nʼiyi.
Jeremiah 48:36 in English
Jeremiah 48:36 · Berean Standard Bible
Therefore My heart laments like a flute for Moab; it laments like a flute for the men of Kir-heres, because the wealth they acquired has perished.
Context
34“A na-anụ ụda iti mkpu akwa ha
site nʼobodo Heshbọn ruo Eleale, na Jehaz.
A na-anụkwa ya site na Zoa ruo, ọ bụladị obodo ndị dị anya, dịka Horonaim, na Eglat Shelishiya.
Nʼihi na mmiri niile nke Nimrim ataala. 35Aga m eme ka ndị ahụ niile na-achụ aja nʼebe niile dị elu,
na ndị ahụ niile na-achụrụ chi ha dị iche iche aja ihe nsure ọkụ na-esi isi ụtọ,
hapụ ịdịkwa nʼala Moab,” otu a ka Onyenwe anyị kwubiri. 36“Ụda akwa nke na-ada nʼime obi m nʼihi Moab dịka ụda ọja.
Ụda akwa nke dịkwa ka ụda ọja na-adakwa nʼime obi m nʼihi ndị Kia Hareset.
Akụ niile ha kpakọtara alaala nʼiyi. 37A kpụchapụla agịrị isi niile,
kpachakwa afụọnụ ha niile.
E bipụkwala aka ha niile.
Ọ bụkwa akwa mkpe ka e ji kpuchie ukwu niile. 38Nʼelu ụlọ niile nke dị na Moab,
nakwa nʼama egwuregwu niile,
ọ dịghị ihe ọzọ karịa naanị iru ụjụ ka a na-ahụ.
Nʼihi na e tiwaala m Moab
dịka e si etiwa ite aja nke ọ dịghị onye bụla chọrọ ya,” otu a ka Onyenwe anyị kwupụtara.
Igbo text and audio: Biblica® Open Igbo Contemporary Bible™, made available under an open license by Biblica, Inc.