Jeremaya 48:35
Jeremiah 48:35 · Biblica® Open Igbo Contemporary Bible 2020
Aga m eme ka ndị ahụ niile na-achụ aja nʼebe niile dị elu, na ndị ahụ niile na-achụrụ chi ha dị iche iche aja ihe nsure ọkụ na-esi isi ụtọ, hapụ ịdịkwa nʼala Moab,” otu a ka Onyenwe anyị kwubiri.
Jeremiah 48:35 in English
Jeremiah 48:35 · Berean Standard Bible
In Moab, declares the LORD, I will bring an end to those who make offerings on the high places and burn incense to their gods.
Context
33Ọṅụ na obi ụtọ ka e wepụrụ
site nʼubi vaịnị niile, na nʼala ubi niile nke Moab.
E meela ka mmanya vaịnị kwụsị ịgbapụtakwa site nʼebe ịzọcha mmanya.
Ọ dịkwaghị onye na-eji mkpu ọṅụ na-azọcha ha,
Ọ bụ ezie na a na-anụ olu iti mkpu,
ma ọ bụghị olu iti mkpu ọṅụ. 34“A na-anụ ụda iti mkpu akwa ha
site nʼobodo Heshbọn ruo Eleale, na Jehaz.
A na-anụkwa ya site na Zoa ruo, ọ bụladị obodo ndị dị anya, dịka Horonaim, na Eglat Shelishiya.
Nʼihi na mmiri niile nke Nimrim ataala. 35Aga m eme ka ndị ahụ niile na-achụ aja nʼebe niile dị elu,
na ndị ahụ niile na-achụrụ chi ha dị iche iche aja ihe nsure ọkụ na-esi isi ụtọ,
hapụ ịdịkwa nʼala Moab,” otu a ka Onyenwe anyị kwubiri. 36“Ụda akwa nke na-ada nʼime obi m nʼihi Moab dịka ụda ọja.
Ụda akwa nke dịkwa ka ụda ọja na-adakwa nʼime obi m nʼihi ndị Kia Hareset.
Akụ niile ha kpakọtara alaala nʼiyi. 37A kpụchapụla agịrị isi niile,
kpachakwa afụọnụ ha niile.
E bipụkwala aka ha niile.
Ọ bụkwa akwa mkpe ka e ji kpuchie ukwu niile.
Igbo text and audio: Biblica® Open Igbo Contemporary Bible™, made available under an open license by Biblica, Inc.