Jeremaya 48:39
Jeremiah 48:39 · Biblica® Open Igbo Contemporary Bible 2020
“Lee ka e si tipịa ya! Lee ka ha si akwasị akwa ike! Leekwa ka Moab si gbakụta azụ ya nʼihi ọnọdụ ihere ya! Moab aghọọla ihe ọchị, ọ ghọọla ihe iju anya nye ndị niile gbara ya gburugburu.”
Jeremiah 48:39 in English
Jeremiah 48:39 · Berean Standard Bible
“How shattered it is! How they wail! How Moab has turned his back in shame! Moab has become an object of ridicule and horror to all those around him.”
Context
37A kpụchapụla agịrị isi niile,
kpachakwa afụọnụ ha niile.
E bipụkwala aka ha niile.
Ọ bụkwa akwa mkpe ka e ji kpuchie ukwu niile. 38Nʼelu ụlọ niile nke dị na Moab,
nakwa nʼama egwuregwu niile,
ọ dịghị ihe ọzọ karịa naanị iru ụjụ ka a na-ahụ.
Nʼihi na e tiwaala m Moab
dịka e si etiwa ite aja nke ọ dịghị onye bụla chọrọ ya,” otu a ka Onyenwe anyị kwupụtara. 39“Lee ka e si tipịa ya! Lee ka ha si akwasị akwa ike!
Leekwa ka Moab si gbakụta azụ ya nʼihi ọnọdụ ihere ya!
Moab aghọọla ihe ọchị,
ọ ghọọla ihe iju anya nye ndị niile gbara ya gburugburu.” 40Ihe ndị a ka Onyenwe anyị kwuru,
“Lee, ọ dị otu ugo na-efedata,
nke gbasapụrụ nku ya kpuchie ala Moab niile. 41A ga-adọta Keriọt nʼagha,
meriekwa ebe ya niile e wusiri ike.
Nʼụbọchị ahụ, obi ndị bụ dike nʼagha nʼala Moab
ga-adị ka obi nwanyị ime na-eme.
Igbo text and audio: Biblica® Open Igbo Contemporary Bible™, made available under an open license by Biblica, Inc.