Jeremaya 46:13
Jeremiah 46:13 · Biblica® Open Igbo Contemporary Bible 2020
Okwu ndị a ka Onyenwe anyị gwara Jeremaya onye amụma, banyere ọbịbịa nke Nebukadneza, bụ eze Babilọn, onye na-abịa ibuso Ijipt agha.
Jeremiah 46:13 in English
Jeremiah 46:13 · Berean Standard Bible
This is the word that the LORD spoke to Jeremiah the prophet about the coming of Nebuchadnezzar king of Babylon to strike the land of Egypt:
Context
11“Rigoro Gilead ka i weta mmanụ a na-ete nʼọnya,
gị Ada Ijipt na-amaghị nwoke.
Ma ọ bụ nʼefu ka ị na-ewebata ọgwụ ndị a niile,
nʼihi na ọgwụgwọ ọbụla agaghị adịrị gị. 12Mba niile ga-anụ akụkọ ihe ihere bịakwasịrị gị.
Nʼakụkụ niile nke ụwa ka a ga-anụkwa ịkwa akwa gị.
Otu dike nʼagha na-asọ ngọngọ na-adakwasị dike ibe ya;
ha abụọ na-adakwa nʼala.” 13Okwu ndị a ka Onyenwe anyị gwara Jeremaya onye amụma, banyere ọbịbịa nke Nebukadneza, bụ eze Babilọn, onye na-abịa ibuso Ijipt agha. 14“Kwupụtanụ ihe ndị a nʼIjipt. Kwusaa ya na Migdol.
Kwusaakwa ya na Memfis, na nʼobodo Tapanhis.
Guzozienụ onwe unu nʼusoro, nọọkwanụ na njikere,
nʼihi na mma agha na-eripịa ndị gbara unu gburugburu. 15Gịnị mere a ga-eji gbudasịa ndị gị niile bụ dike nʼagha?
Ha agaghị enwe ike guzokwa, nʼihi na Onyenwe anyị ga-akwada ha.
Igbo text and audio: Biblica® Open Igbo Contemporary Bible™, made available under an open license by Biblica, Inc.