Jeremaya 46:14
Jeremiah 46:14 · Biblica® Open Igbo Contemporary Bible 2020
“Kwupụtanụ ihe ndị a nʼIjipt. Kwusaa ya na Migdol. Kwusaakwa ya na Memfis, na nʼobodo Tapanhis. Guzozienụ onwe unu nʼusoro, nọọkwanụ na njikere, nʼihi na mma agha na-eripịa ndị gbara unu gburugburu.
Jeremiah 46:14 in English
Jeremiah 46:14 · Berean Standard Bible
“Announce it in Egypt, and proclaim it in Migdol; proclaim it in Memphis * and Tahpanhes: ‘Take your positions and prepare yourself, for the sword devours those around you.’
Context
12Mba niile ga-anụ akụkọ ihe ihere bịakwasịrị gị.
Nʼakụkụ niile nke ụwa ka a ga-anụkwa ịkwa akwa gị.
Otu dike nʼagha na-asọ ngọngọ na-adakwasị dike ibe ya;
ha abụọ na-adakwa nʼala.” 13Okwu ndị a ka Onyenwe anyị gwara Jeremaya onye amụma, banyere ọbịbịa nke Nebukadneza, bụ eze Babilọn, onye na-abịa ibuso Ijipt agha. 14“Kwupụtanụ ihe ndị a nʼIjipt. Kwusaa ya na Migdol.
Kwusaakwa ya na Memfis, na nʼobodo Tapanhis.
Guzozienụ onwe unu nʼusoro, nọọkwanụ na njikere,
nʼihi na mma agha na-eripịa ndị gbara unu gburugburu. 15Gịnị mere a ga-eji gbudasịa ndị gị niile bụ dike nʼagha?
Ha agaghị enwe ike guzokwa, nʼihi na Onyenwe anyị ga-akwada ha. 16Ha ga-asọ ngọngọ mgbe mgbe,
ha ga-adakwasịkwa nʼelu ibe ha.
Ha ga-asịkwa, ‘Bilienụ ọtọ, bịanụ ka anyị laghachikwuru ndị anyị,
ka anyị laghachikwa nʼala ebe a mụrụ anyị,
ka anyị wezugakwa onwe anyị site na mma agha nke ndị mmegbu.’
Igbo text and audio: Biblica® Open Igbo Contemporary Bible™, made available under an open license by Biblica, Inc.