Jeremaya 46:16
Jeremiah 46:16 · Biblica® Open Igbo Contemporary Bible 2020
Ha ga-asọ ngọngọ mgbe mgbe, ha ga-adakwasịkwa nʼelu ibe ha. Ha ga-asịkwa, ‘Bilienụ ọtọ, bịanụ ka anyị laghachikwuru ndị anyị, ka anyị laghachikwa nʼala ebe a mụrụ anyị, ka anyị wezugakwa onwe anyị site na mma agha nke ndị mmegbu.’
Jeremiah 46:16 in English
Jeremiah 46:16 · Berean Standard Bible
They continue to stumble; indeed, they have fallen over one another. They say, ‘Get up! Let us return to our people and to the land of our birth, away from the sword of the oppressor.’
Context
14“Kwupụtanụ ihe ndị a nʼIjipt. Kwusaa ya na Migdol.
Kwusaakwa ya na Memfis, na nʼobodo Tapanhis.
Guzozienụ onwe unu nʼusoro, nọọkwanụ na njikere,
nʼihi na mma agha na-eripịa ndị gbara unu gburugburu. 15Gịnị mere a ga-eji gbudasịa ndị gị niile bụ dike nʼagha?
Ha agaghị enwe ike guzokwa, nʼihi na Onyenwe anyị ga-akwada ha. 16Ha ga-asọ ngọngọ mgbe mgbe,
ha ga-adakwasịkwa nʼelu ibe ha.
Ha ga-asịkwa, ‘Bilienụ ọtọ, bịanụ ka anyị laghachikwuru ndị anyị,
ka anyị laghachikwa nʼala ebe a mụrụ anyị,
ka anyị wezugakwa onwe anyị site na mma agha nke ndị mmegbu.’ 17Nʼebe ahụ ka ha ga-anọ tie mkpu sị,
‘Fero eze Ijipt bụ naanị onye oke okwu.
Lee, oge a kara aka nye ya efunarịla ya.’ 18“Dịka mụ onwe m na-adị ndụ,” ka Eze ahụ kwupụtara,
onye aha ya bụ Onyenwe anyị, Onye pụrụ ime ihe niile,
“otu onye ga-abịa, onye dị ukwuu dịka ugwu Taboa si dị ukwuu nʼebe ugwu ndị ọzọ dị,
na dịka Kamel si dịrị nʼakụkụ osimiri.
Igbo text and audio: Biblica® Open Igbo Contemporary Bible™, made available under an open license by Biblica, Inc.