Jeremaya 46:12
Jeremiah 46:12 · Biblica® Open Igbo Contemporary Bible 2020
Mba niile ga-anụ akụkọ ihe ihere bịakwasịrị gị. Nʼakụkụ niile nke ụwa ka a ga-anụkwa ịkwa akwa gị. Otu dike nʼagha na-asọ ngọngọ na-adakwasị dike ibe ya; ha abụọ na-adakwa nʼala.”
Jeremiah 46:12 in English
Jeremiah 46:12 · Berean Standard Bible
The nations have heard of your shame, and your outcry fills the earth, because warrior stumbles over warrior and both of them have fallen together.”
Context
10Ma ụbọchị ahụ dịrị Onyenwe anyị, bụ Onyenwe anyị, Onye pụrụ ime ihe niile.
Ọ bụ ụbọchị ịbọ ọbọ ya, ụbọchị ọ ga-abọrọ ọbọ nʼahụ ndị iro ya.
Mma agha ga-eripịa ha tutu afọ eju ya,
e, tutu ruo mgbe ọ ṅụjuru ọbara afọ.
Nʼihi na Onyenwe anyị bụ Onyenwe anyị, Onye pụrụ ime ihe niile ga-achụ aja nʼala ahụ dị nʼugwu,
nke dị nso osimiri Yufretis. 11“Rigoro Gilead ka i weta mmanụ a na-ete nʼọnya,
gị Ada Ijipt na-amaghị nwoke.
Ma ọ bụ nʼefu ka ị na-ewebata ọgwụ ndị a niile,
nʼihi na ọgwụgwọ ọbụla agaghị adịrị gị. 12Mba niile ga-anụ akụkọ ihe ihere bịakwasịrị gị.
Nʼakụkụ niile nke ụwa ka a ga-anụkwa ịkwa akwa gị.
Otu dike nʼagha na-asọ ngọngọ na-adakwasị dike ibe ya;
ha abụọ na-adakwa nʼala.” 13Okwu ndị a ka Onyenwe anyị gwara Jeremaya onye amụma, banyere ọbịbịa nke Nebukadneza, bụ eze Babilọn, onye na-abịa ibuso Ijipt agha. 14“Kwupụtanụ ihe ndị a nʼIjipt. Kwusaa ya na Migdol.
Kwusaakwa ya na Memfis, na nʼobodo Tapanhis.
Guzozienụ onwe unu nʼusoro, nọọkwanụ na njikere,
nʼihi na mma agha na-eripịa ndị gbara unu gburugburu.
Igbo text and audio: Biblica® Open Igbo Contemporary Bible™, made available under an open license by Biblica, Inc.