Jeremaya 46:11
Jeremiah 46:11 · Biblica® Open Igbo Contemporary Bible 2020
“Rigoro Gilead ka i weta mmanụ a na-ete nʼọnya, gị Ada Ijipt na-amaghị nwoke. Ma ọ bụ nʼefu ka ị na-ewebata ọgwụ ndị a niile, nʼihi na ọgwụgwọ ọbụla agaghị adịrị gị.
Jeremiah 46:11 in English
Jeremiah 46:11 · Berean Standard Bible
Go up to Gilead for balm, O Virgin Daughter of Egypt! In vain you try many remedies, but for you there is no healing.
Context
9Gbabanyenụ nʼọgbọ agha, unu ịnyịnya niile.
Gbanụ ọkụ ọkụ, unu ndị na-agba ụgbọ agha.
Zọọnụ ike ike, unu ndị bụ dike nʼagha, unu ndị ikom Kush na Put, ndị na-ebu ọta,
na unu ndị ikom Lidiya ndị na-agba ụta. 10Ma ụbọchị ahụ dịrị Onyenwe anyị, bụ Onyenwe anyị, Onye pụrụ ime ihe niile.
Ọ bụ ụbọchị ịbọ ọbọ ya, ụbọchị ọ ga-abọrọ ọbọ nʼahụ ndị iro ya.
Mma agha ga-eripịa ha tutu afọ eju ya,
e, tutu ruo mgbe ọ ṅụjuru ọbara afọ.
Nʼihi na Onyenwe anyị bụ Onyenwe anyị, Onye pụrụ ime ihe niile ga-achụ aja nʼala ahụ dị nʼugwu,
nke dị nso osimiri Yufretis. 11“Rigoro Gilead ka i weta mmanụ a na-ete nʼọnya,
gị Ada Ijipt na-amaghị nwoke.
Ma ọ bụ nʼefu ka ị na-ewebata ọgwụ ndị a niile,
nʼihi na ọgwụgwọ ọbụla agaghị adịrị gị. 12Mba niile ga-anụ akụkọ ihe ihere bịakwasịrị gị.
Nʼakụkụ niile nke ụwa ka a ga-anụkwa ịkwa akwa gị.
Otu dike nʼagha na-asọ ngọngọ na-adakwasị dike ibe ya;
ha abụọ na-adakwa nʼala.” 13Okwu ndị a ka Onyenwe anyị gwara Jeremaya onye amụma, banyere ọbịbịa nke Nebukadneza, bụ eze Babilọn, onye na-abịa ibuso Ijipt agha.
Igbo text and audio: Biblica® Open Igbo Contemporary Bible™, made available under an open license by Biblica, Inc.