Jeremaya 46:9
Jeremiah 46:9 · Biblica® Open Igbo Contemporary Bible 2020
Gbabanyenụ nʼọgbọ agha, unu ịnyịnya niile. Gbanụ ọkụ ọkụ, unu ndị na-agba ụgbọ agha. Zọọnụ ike ike, unu ndị bụ dike nʼagha, unu ndị ikom Kush na Put, ndị na-ebu ọta, na unu ndị ikom Lidiya ndị na-agba ụta.
Jeremiah 46:9 in English
Jeremiah 46:9 · Berean Standard Bible
Advance, O horses! Race furiously, O chariots! Let the warriors come forth— Cush * and Put carrying their shields, men of Lydia drawing the bow.
Context
7“Onye bụ onye a, nke na-ebili* ọtọ dịka osimiri Naịl,
na dịka osimiri nke mmiri ya na-amagharị? 8Ijipt na-ebili elu dịka osimiri Naịl,
dịka osimiri nke mmiri ya na-amagharị.
Ọ na-asị, ‘Aga m ebili kpuchie ụwa niile.
Aga m ebibi obodo ukwu dị iche iche, na ndị mmadụ bi nʼime ha.’ 9Gbabanyenụ nʼọgbọ agha, unu ịnyịnya niile.
Gbanụ ọkụ ọkụ, unu ndị na-agba ụgbọ agha.
Zọọnụ ike ike, unu ndị bụ dike nʼagha, unu ndị ikom Kush na Put, ndị na-ebu ọta,
na unu ndị ikom Lidiya ndị na-agba ụta. 10Ma ụbọchị ahụ dịrị Onyenwe anyị, bụ Onyenwe anyị, Onye pụrụ ime ihe niile.
Ọ bụ ụbọchị ịbọ ọbọ ya, ụbọchị ọ ga-abọrọ ọbọ nʼahụ ndị iro ya.
Mma agha ga-eripịa ha tutu afọ eju ya,
e, tutu ruo mgbe ọ ṅụjuru ọbara afọ.
Nʼihi na Onyenwe anyị bụ Onyenwe anyị, Onye pụrụ ime ihe niile ga-achụ aja nʼala ahụ dị nʼugwu,
nke dị nso osimiri Yufretis. 11“Rigoro Gilead ka i weta mmanụ a na-ete nʼọnya,
gị Ada Ijipt na-amaghị nwoke.
Ma ọ bụ nʼefu ka ị na-ewebata ọgwụ ndị a niile,
nʼihi na ọgwụgwọ ọbụla agaghị adịrị gị.
Igbo text and audio: Biblica® Open Igbo Contemporary Bible™, made available under an open license by Biblica, Inc.