Jeremaya 46:7
Jeremiah 46:7 · Biblica® Open Igbo Contemporary Bible 2020
“Onye bụ onye a, nke na-ebili* ọtọ dịka osimiri Naịl, na dịka osimiri nke mmiri ya na-amagharị?
Jeremiah 46:7 in English
Jeremiah 46:7 · Berean Standard Bible
Who is this, rising like the Nile, like rivers whose waters churn?
Context
5Gịnị ka anya m abụọ hụrụ?
Ụjọ na-atụ ha,
ha na-agbaghachikwa azụ;
lee, a na-etipịa ndị ha bụ dike nʼagha.
Ha na-agbasi ọsọ ike,
na-eleghị anya nʼazụ.
Egwu dịkwa nʼakụkụ niile,” otu a ka Onyenwe anyị kwupụtara. 6“Ndị nwere ụkwụ ọsọ enweghị ike ịgbalaga,
ndị dị ike enweghị ike isi nʼebe ahụ wezuga onwe ha.
Ha na-asọ ngọngọ daa,
nʼakụkụ ugwu dị nso nʼosimiri Yufretis. 7“Onye bụ onye a, nke na-ebili* ọtọ dịka osimiri Naịl,
na dịka osimiri nke mmiri ya na-amagharị? 8Ijipt na-ebili elu dịka osimiri Naịl,
dịka osimiri nke mmiri ya na-amagharị.
Ọ na-asị, ‘Aga m ebili kpuchie ụwa niile.
Aga m ebibi obodo ukwu dị iche iche, na ndị mmadụ bi nʼime ha.’ 9Gbabanyenụ nʼọgbọ agha, unu ịnyịnya niile.
Gbanụ ọkụ ọkụ, unu ndị na-agba ụgbọ agha.
Zọọnụ ike ike, unu ndị bụ dike nʼagha, unu ndị ikom Kush na Put, ndị na-ebu ọta,
na unu ndị ikom Lidiya ndị na-agba ụta.
Igbo text and audio: Biblica® Open Igbo Contemporary Bible™, made available under an open license by Biblica, Inc.