Jeremaya 46:5
Jeremiah 46:5 · Biblica® Open Igbo Contemporary Bible 2020
Gịnị ka anya m abụọ hụrụ? Ụjọ na-atụ ha, ha na-agbaghachikwa azụ; lee, a na-etipịa ndị ha bụ dike nʼagha. Ha na-agbasi ọsọ ike, na-eleghị anya nʼazụ. Egwu dịkwa nʼakụkụ niile,” otu a ka Onyenwe anyị kwupụtara.
Jeremiah 46:5 in English
Jeremiah 46:5 · Berean Standard Bible
Why am I seeing this? They are terrified, they are retreating; their warriors are defeated, they flee in haste without looking back; terror is on every side!” declares the LORD.
Context
3“Kwadoonụ ọta agha unu, ndị ukwu na ndị nta,
zọpụnụ ije maka ibu agha. 4Kegidezienụ ịnyịnya unu,
rịkwasịkwanụ nʼelu ha.
Guzokwanụ nʼọnọdụ ibu agha unu,
ma kpukwasịkwanụ onwe unu okpu agha unu.
Mụọnụ ùbe unu ka ọ dị nkọ,
yikwasịkwanụ uwe agha unu. 5Gịnị ka anya m abụọ hụrụ?
Ụjọ na-atụ ha,
ha na-agbaghachikwa azụ;
lee, a na-etipịa ndị ha bụ dike nʼagha.
Ha na-agbasi ọsọ ike,
na-eleghị anya nʼazụ.
Egwu dịkwa nʼakụkụ niile,” otu a ka Onyenwe anyị kwupụtara. 6“Ndị nwere ụkwụ ọsọ enweghị ike ịgbalaga,
ndị dị ike enweghị ike isi nʼebe ahụ wezuga onwe ha.
Ha na-asọ ngọngọ daa,
nʼakụkụ ugwu dị nso nʼosimiri Yufretis. 7“Onye bụ onye a, nke na-ebili* ọtọ dịka osimiri Naịl,
na dịka osimiri nke mmiri ya na-amagharị?
Igbo text and audio: Biblica® Open Igbo Contemporary Bible™, made available under an open license by Biblica, Inc.