Jeremaya 46:4
Jeremiah 46:4 · Biblica® Open Igbo Contemporary Bible 2020
Kegidezienụ ịnyịnya unu, rịkwasịkwanụ nʼelu ha. Guzokwanụ nʼọnọdụ ibu agha unu, ma kpukwasịkwanụ onwe unu okpu agha unu. Mụọnụ ùbe unu ka ọ dị nkọ, yikwasịkwanụ uwe agha unu.
Jeremiah 46:4 in English
Jeremiah 46:4 · Berean Standard Bible
Harness the horses; mount the steeds; take your positions with helmets on! Polish your spears; put on armor!
Context
2Nke dịrị Ijipt:
Ndị a bụ okwu dị megide usuu ndị agha Fero Neko, bụ eze Ijipt, ndị Nebukadneza eze Babilọn meriri nʼagha na Kakemish, nʼakụkụ osimiri Yufretis, nʼafọ nke anọ nke ọchịchị Jehoiakim nwa Josaya, bụ eze Juda. 3“Kwadoonụ ọta agha unu, ndị ukwu na ndị nta,
zọpụnụ ije maka ibu agha. 4Kegidezienụ ịnyịnya unu,
rịkwasịkwanụ nʼelu ha.
Guzokwanụ nʼọnọdụ ibu agha unu,
ma kpukwasịkwanụ onwe unu okpu agha unu.
Mụọnụ ùbe unu ka ọ dị nkọ,
yikwasịkwanụ uwe agha unu. 5Gịnị ka anya m abụọ hụrụ?
Ụjọ na-atụ ha,
ha na-agbaghachikwa azụ;
lee, a na-etipịa ndị ha bụ dike nʼagha.
Ha na-agbasi ọsọ ike,
na-eleghị anya nʼazụ.
Egwu dịkwa nʼakụkụ niile,” otu a ka Onyenwe anyị kwupụtara. 6“Ndị nwere ụkwụ ọsọ enweghị ike ịgbalaga,
ndị dị ike enweghị ike isi nʼebe ahụ wezuga onwe ha.
Ha na-asọ ngọngọ daa,
nʼakụkụ ugwu dị nso nʼosimiri Yufretis.
Igbo text and audio: Biblica® Open Igbo Contemporary Bible™, made available under an open license by Biblica, Inc.