Jeremaya 4:27
Jeremiah 4:27 · Biblica® Open Igbo Contemporary Bible 2020
Ihe a ka Onyenwe anyị kwuru, “A ga-ebibi ala ahụ niile, ma agaghị m ebibicha ya kpamkpam.
Jeremiah 4:27 in English
Jeremiah 4:27 · Berean Standard Bible
For this is what the LORD says: “The whole land will be desolate, but I will not finish its destruction.
Context
25Elere m anya ma ahụghị mmadụ ọbụla,
ụmụ nnụnụ niile dị na mbara eluigwe efefusịala. 26Ala ọma ahụ aghọọla ọzara,
obodo niile aghọọla mkputamkpu ebe
nʼihu Onyenwe anyị, nʼihu oke iwe ya. 27Ihe a ka Onyenwe anyị kwuru,
“A ga-ebibi ala ahụ niile,
ma agaghị m ebibicha ya kpamkpam. 28Ụwa ga-eru ụjụ,
mbara eluigwe ga-agbakwa ọchịchịrị.
Nʼihi na ekwuola ya, agaghị m agbanwe obi m.
Ekpebiela m ya, agaghị m alakwa azụ nʼihe m zubere ime.” 29Ndị mmadụ niile ga-agbapụ ọsọ site nʼobodo ha
mgbe ha nụrụ ụzụ ndị agha na-agba ụta nọ nʼelu ịnyịnya na-abịa nso nso.
Ha ga-ezo onwe ha nʼọhịa;
ndị ọzọkwa ga-agbalaga zoo onwe ha nʼugwu ukwu.
Obodo ha niile ga-atọgbọrọkwa nʼefu,
mgbe ndị mmadụ si nʼime ya gbapụ ọsọ nʼihi oke ihe egwu.
Igbo text and audio: Biblica® Open Igbo Contemporary Bible™, made available under an open license by Biblica, Inc.