Jeremaya 4:28
Jeremiah 4:28 · Biblica® Open Igbo Contemporary Bible 2020
Ụwa ga-eru ụjụ, mbara eluigwe ga-agbakwa ọchịchịrị. Nʼihi na ekwuola ya, agaghị m agbanwe obi m. Ekpebiela m ya, agaghị m alakwa azụ nʼihe m zubere ime.”
Jeremiah 4:28 in English
Jeremiah 4:28 · Berean Standard Bible
Therefore the earth will mourn and the heavens above will grow dark. I have spoken, I have planned, and I will not relent or turn back.”
Context
26Ala ọma ahụ aghọọla ọzara,
obodo niile aghọọla mkputamkpu ebe
nʼihu Onyenwe anyị, nʼihu oke iwe ya. 27Ihe a ka Onyenwe anyị kwuru,
“A ga-ebibi ala ahụ niile,
ma agaghị m ebibicha ya kpamkpam. 28Ụwa ga-eru ụjụ,
mbara eluigwe ga-agbakwa ọchịchịrị.
Nʼihi na ekwuola ya, agaghị m agbanwe obi m.
Ekpebiela m ya, agaghị m alakwa azụ nʼihe m zubere ime.” 29Ndị mmadụ niile ga-agbapụ ọsọ site nʼobodo ha
mgbe ha nụrụ ụzụ ndị agha na-agba ụta nọ nʼelu ịnyịnya na-abịa nso nso.
Ha ga-ezo onwe ha nʼọhịa;
ndị ọzọkwa ga-agbalaga zoo onwe ha nʼugwu ukwu.
Obodo ha niile ga-atọgbọrọkwa nʼefu,
mgbe ndị mmadụ si nʼime ya gbapụ ọsọ nʼihi oke ihe egwu. 30Gịnị bụ nke a, gị onye na-enweghị olileanya?
Gịnị mere unu ji yiri uwe uhie,
were ọlaolu ọlaedo dị oke ọnụ yiri nʼolu?
Gịnị mere unu ji were ihe ịchọ mma tee nʼanya unu?
Nʼefu ka unu na-eme onwe unu ka unu dị mma.
Ndị iko unu na-elelị unu;
ndụ unu ka ha na-achọkwa.
Igbo text and audio: Biblica® Open Igbo Contemporary Bible™, made available under an open license by Biblica, Inc.