Jeremaya 4:29
Jeremiah 4:29 · Biblica® Open Igbo Contemporary Bible 2020
Ndị mmadụ niile ga-agbapụ ọsọ site nʼobodo ha mgbe ha nụrụ ụzụ ndị agha na-agba ụta nọ nʼelu ịnyịnya na-abịa nso nso. Ha ga-ezo onwe ha nʼọhịa; ndị ọzọkwa ga-agbalaga zoo onwe ha nʼugwu ukwu. Obodo ha niile ga-atọgbọrọkwa nʼefu, mgbe ndị mmadụ si nʼime ya gbapụ ọsọ nʼihi oke ihe egwu.
Jeremiah 4:29 in English
Jeremiah 4:29 · Berean Standard Bible
Every city flees at the sound of the horseman and archer. They enter the thickets and climb among the rocks. Every city is abandoned; no inhabitant is left.
Context
27Ihe a ka Onyenwe anyị kwuru,
“A ga-ebibi ala ahụ niile,
ma agaghị m ebibicha ya kpamkpam. 28Ụwa ga-eru ụjụ,
mbara eluigwe ga-agbakwa ọchịchịrị.
Nʼihi na ekwuola ya, agaghị m agbanwe obi m.
Ekpebiela m ya, agaghị m alakwa azụ nʼihe m zubere ime.” 29Ndị mmadụ niile ga-agbapụ ọsọ site nʼobodo ha
mgbe ha nụrụ ụzụ ndị agha na-agba ụta nọ nʼelu ịnyịnya na-abịa nso nso.
Ha ga-ezo onwe ha nʼọhịa;
ndị ọzọkwa ga-agbalaga zoo onwe ha nʼugwu ukwu.
Obodo ha niile ga-atọgbọrọkwa nʼefu,
mgbe ndị mmadụ si nʼime ya gbapụ ọsọ nʼihi oke ihe egwu. 30Gịnị bụ nke a, gị onye na-enweghị olileanya?
Gịnị mere unu ji yiri uwe uhie,
were ọlaolu ọlaedo dị oke ọnụ yiri nʼolu?
Gịnị mere unu ji were ihe ịchọ mma tee nʼanya unu?
Nʼefu ka unu na-eme onwe unu ka unu dị mma.
Ndị iko unu na-elelị unu;
ndụ unu ka ha na-achọkwa. 31Ana m anụ olu iti mkpu akwa nke yiri olu akwa nwanyị ime na-eme,
ọ dị ka ude nwanyị na-agbalị ịmụpụta nwa mbụ ya.
Ma olu akwa m nụrụ bụ nke ada Zayọn, ebe ọ nọ na-eku ume ike ike.
Ọ dara nʼala gbasapụ aka ya, ma na-akwa akwa na-asị,
“Onye nwụrụ anwụ ka m bụ!
Lee, ndụ m ka e nyere ndị ogbu mmadụ.”
Igbo text and audio: Biblica® Open Igbo Contemporary Bible™, made available under an open license by Biblica, Inc.