Jeremaya 4:31
Jeremiah 4:31 · Biblica® Open Igbo Contemporary Bible 2020
Ana m anụ olu iti mkpu akwa nke yiri olu akwa nwanyị ime na-eme, ọ dị ka ude nwanyị na-agbalị ịmụpụta nwa mbụ ya. Ma olu akwa m nụrụ bụ nke ada Zayọn, ebe ọ nọ na-eku ume ike ike. Ọ dara nʼala gbasapụ aka ya, ma na-akwa akwa na-asị, “Onye nwụrụ anwụ ka m bụ! Lee, ndụ m ka e nyere ndị ogbu mmadụ.”
Jeremiah 4:31 in English
Jeremiah 4:31 · Berean Standard Bible
For I hear a cry like a woman in labor, a cry of anguish like one bearing her first child— the cry of the Daughter of Zion gasping for breath, stretching out her hands to say, “Woe is me, for my soul faints before the murderers!”
Context
29Ndị mmadụ niile ga-agbapụ ọsọ site nʼobodo ha
mgbe ha nụrụ ụzụ ndị agha na-agba ụta nọ nʼelu ịnyịnya na-abịa nso nso.
Ha ga-ezo onwe ha nʼọhịa;
ndị ọzọkwa ga-agbalaga zoo onwe ha nʼugwu ukwu.
Obodo ha niile ga-atọgbọrọkwa nʼefu,
mgbe ndị mmadụ si nʼime ya gbapụ ọsọ nʼihi oke ihe egwu. 30Gịnị bụ nke a, gị onye na-enweghị olileanya?
Gịnị mere unu ji yiri uwe uhie,
were ọlaolu ọlaedo dị oke ọnụ yiri nʼolu?
Gịnị mere unu ji were ihe ịchọ mma tee nʼanya unu?
Nʼefu ka unu na-eme onwe unu ka unu dị mma.
Ndị iko unu na-elelị unu;
ndụ unu ka ha na-achọkwa. 31Ana m anụ olu iti mkpu akwa nke yiri olu akwa nwanyị ime na-eme,
ọ dị ka ude nwanyị na-agbalị ịmụpụta nwa mbụ ya.
Ma olu akwa m nụrụ bụ nke ada Zayọn, ebe ọ nọ na-eku ume ike ike.
Ọ dara nʼala gbasapụ aka ya, ma na-akwa akwa na-asị,
“Onye nwụrụ anwụ ka m bụ!
Lee, ndụ m ka e nyere ndị ogbu mmadụ.”
Igbo text and audio: Biblica® Open Igbo Contemporary Bible™, made available under an open license by Biblica, Inc.