Jeremaya 25:30
Jeremiah 25:30 · Biblica® Open Igbo Contemporary Bible 2020
“Ugbu a buo amụma ndị a niile megide ha, sị ha, “ ‘Onyenwe anyị ga-esi nʼelu bigbọọ; ọ ga-esitekwa nʼebe obibi ya dị nsọ mee ka olu ya daa ụda. Ọ ga-ebigbọsị ike megide ala ya Ọ ga-eti mkpu dịka ndị ahụ na-azọcha mkpụrụ vaịnị; ọ ga-eti mkpu megide ndị niile bi nʼụwa.
Jeremiah 25:30 in English
Jeremiah 25:30 · Berean Standard Bible
So you are to prophesy all these words against them and say to them: ‘The LORD will roar from on high; He will raise His voice from His holy habitation. He will roar loudly over His pasture; like those who tread the grapes, He will call out with a shout against all the inhabitants of the earth.
Context
28Ọ bụrụ na ha ajụ ịnara gị iko a site na ya ṅụtụ ihe dị ya nʼime, gwa ha sị, ‘Unu ga-aṅụrịrị ya, nʼihi na otu a ka Onyenwe anyị, Onye pụrụ ime ihe niile kwuru. 29Lee, ana m amalite ime ka mbibi bịakwasị obodo ahụ a kpọkwasịrị aha m. Ma unu ga-esi aṅaa gbanarị ahụhụ? Unu agaghị agbanarị ahụhụ, nʼihi na ana m enye iwu ka e webata mma agha nʼetiti ndị niile bi nʼụwa. Otu a ka Onyenwe anyị, Onye pụrụ ime ihe niile kwubiri.’ 30“Ugbu a buo amụma ndị a niile megide ha, sị ha,
“ ‘Onyenwe anyị ga-esi nʼelu bigbọọ;
ọ ga-esitekwa nʼebe obibi ya dị nsọ mee ka olu ya daa ụda.
Ọ ga-ebigbọsị ike megide ala ya
Ọ ga-eti mkpu dịka ndị ahụ na-azọcha mkpụrụ vaịnị;
ọ ga-eti mkpu megide ndị niile bi nʼụwa. 31Ụda mkpọtụ ahụ ga-eru na nsọtụ niile nke ụwa,
nʼihi na Onyenwe anyị ga-ebo mba niile nke ụwa ebubo.
Ọ ga-eme ka ikpe ọmụma rute mmadụ niile,
meekwa ka e jiri mma agha bibie ndị ajọ omume.’ ”
Otu a ka Onyenwe anyị kwubiri. 32Ihe ndị a ka Onyenwe anyị, Onye pụrụ ime ihe niile kwuru,
“Lee, mbibi na-agbasa
site nʼotu mba na-eru na mba ọzọ;
oke ifufe na-abịakwa
site na nsọtụ niile nke ụwa.”
Igbo text and audio: Biblica® Open Igbo Contemporary Bible™, made available under an open license by Biblica, Inc.