Jeremaya 25:28
Jeremiah 25:28 · Biblica® Open Igbo Contemporary Bible 2020
Ọ bụrụ na ha ajụ ịnara gị iko a site na ya ṅụtụ ihe dị ya nʼime, gwa ha sị, ‘Unu ga-aṅụrịrị ya, nʼihi na otu a ka Onyenwe anyị, Onye pụrụ ime ihe niile kwuru.
Jeremiah 25:28 in English
Jeremiah 25:28 · Berean Standard Bible
If they refuse to take the cup from your hand and drink it, you are to tell them that this is what the LORD of Hosts says: ‘You most certainly must drink it!
Context
26na ndị eze ala dị nʼugwu, na mba dị nso, na mba dị anya, ha niile nʼotu nʼotu, na alaeze niile dị nʼụwa.
Mgbe eze ndị a niile ṅụtụrụ site nʼihe dị nʼiko ahụ, eze Sheshak ga-esitekwa na ya ṅụrụ. 27“Mgbe ahụ, gwakwa ha sị, ‘Ihe ndị a ka Onyenwe anyị, Onye pụrụ ime ihe niile, bụ Chineke Izrel kwuru: Ṅụọnụ, ṅụbiganụ oke; gbọọkwanụ agbọọ, daanụ nʼala ebe unu na-agaghị esi bilitekwa ọzọ, nʼihi mma agha m ga-ezite nʼetiti unu.’ 28Ọ bụrụ na ha ajụ ịnara gị iko a site na ya ṅụtụ ihe dị ya nʼime, gwa ha sị, ‘Unu ga-aṅụrịrị ya, nʼihi na otu a ka Onyenwe anyị, Onye pụrụ ime ihe niile kwuru. 29Lee, ana m amalite ime ka mbibi bịakwasị obodo ahụ a kpọkwasịrị aha m. Ma unu ga-esi aṅaa gbanarị ahụhụ? Unu agaghị agbanarị ahụhụ, nʼihi na ana m enye iwu ka e webata mma agha nʼetiti ndị niile bi nʼụwa. Otu a ka Onyenwe anyị, Onye pụrụ ime ihe niile kwubiri.’ 30“Ugbu a buo amụma ndị a niile megide ha, sị ha,
“ ‘Onyenwe anyị ga-esi nʼelu bigbọọ;
ọ ga-esitekwa nʼebe obibi ya dị nsọ mee ka olu ya daa ụda.
Ọ ga-ebigbọsị ike megide ala ya
Ọ ga-eti mkpu dịka ndị ahụ na-azọcha mkpụrụ vaịnị;
ọ ga-eti mkpu megide ndị niile bi nʼụwa.
Igbo text and audio: Biblica® Open Igbo Contemporary Bible™, made available under an open license by Biblica, Inc.