Jeremaya 25:26
Jeremiah 25:26 · Biblica® Open Igbo Contemporary Bible 2020
na ndị eze ala dị nʼugwu, na mba dị nso, na mba dị anya, ha niile nʼotu nʼotu, na alaeze niile dị nʼụwa. Mgbe eze ndị a niile ṅụtụrụ site nʼihe dị nʼiko ahụ, eze Sheshak ga-esitekwa na ya ṅụrụ.
Jeremiah 25:26 in English
Jeremiah 25:26 · Berean Standard Bible
all the kings of the north, both near and far, one after another—all the kingdoms on the face of the earth. And after all of them, the king of Sheshach * will drink it too.
Context
24Na ndị eze Arebịa, na ndị eze mba niile ndị ahụ bi nʼọzara; 25na ndị eze Zimri, na Elam, na Midia; 26na ndị eze ala dị nʼugwu, na mba dị nso, na mba dị anya, ha niile nʼotu nʼotu, na alaeze niile dị nʼụwa.
Mgbe eze ndị a niile ṅụtụrụ site nʼihe dị nʼiko ahụ, eze Sheshak ga-esitekwa na ya ṅụrụ. 27“Mgbe ahụ, gwakwa ha sị, ‘Ihe ndị a ka Onyenwe anyị, Onye pụrụ ime ihe niile, bụ Chineke Izrel kwuru: Ṅụọnụ, ṅụbiganụ oke; gbọọkwanụ agbọọ, daanụ nʼala ebe unu na-agaghị esi bilitekwa ọzọ, nʼihi mma agha m ga-ezite nʼetiti unu.’ 28Ọ bụrụ na ha ajụ ịnara gị iko a site na ya ṅụtụ ihe dị ya nʼime, gwa ha sị, ‘Unu ga-aṅụrịrị ya, nʼihi na otu a ka Onyenwe anyị, Onye pụrụ ime ihe niile kwuru.
Igbo text and audio: Biblica® Open Igbo Contemporary Bible™, made available under an open license by Biblica, Inc.