Jeremaya 25:27
Jeremiah 25:27 · Biblica® Open Igbo Contemporary Bible 2020
“Mgbe ahụ, gwakwa ha sị, ‘Ihe ndị a ka Onyenwe anyị, Onye pụrụ ime ihe niile, bụ Chineke Izrel kwuru: Ṅụọnụ, ṅụbiganụ oke; gbọọkwanụ agbọọ, daanụ nʼala ebe unu na-agaghị esi bilitekwa ọzọ, nʼihi mma agha m ga-ezite nʼetiti unu.’
Jeremiah 25:27 in English
Jeremiah 25:27 · Berean Standard Bible
“Then you are to tell them that this is what the LORD of Hosts, the God of Israel, says: ‘Drink, get drunk, and vomit. Fall down and never get up again, because of the sword I will send among you.’
Context
25na ndị eze Zimri, na Elam, na Midia; 26na ndị eze ala dị nʼugwu, na mba dị nso, na mba dị anya, ha niile nʼotu nʼotu, na alaeze niile dị nʼụwa.
Mgbe eze ndị a niile ṅụtụrụ site nʼihe dị nʼiko ahụ, eze Sheshak ga-esitekwa na ya ṅụrụ. 27“Mgbe ahụ, gwakwa ha sị, ‘Ihe ndị a ka Onyenwe anyị, Onye pụrụ ime ihe niile, bụ Chineke Izrel kwuru: Ṅụọnụ, ṅụbiganụ oke; gbọọkwanụ agbọọ, daanụ nʼala ebe unu na-agaghị esi bilitekwa ọzọ, nʼihi mma agha m ga-ezite nʼetiti unu.’ 28Ọ bụrụ na ha ajụ ịnara gị iko a site na ya ṅụtụ ihe dị ya nʼime, gwa ha sị, ‘Unu ga-aṅụrịrị ya, nʼihi na otu a ka Onyenwe anyị, Onye pụrụ ime ihe niile kwuru. 29Lee, ana m amalite ime ka mbibi bịakwasị obodo ahụ a kpọkwasịrị aha m. Ma unu ga-esi aṅaa gbanarị ahụhụ? Unu agaghị agbanarị ahụhụ, nʼihi na ana m enye iwu ka e webata mma agha nʼetiti ndị niile bi nʼụwa. Otu a ka Onyenwe anyị, Onye pụrụ ime ihe niile kwubiri.’
Igbo text and audio: Biblica® Open Igbo Contemporary Bible™, made available under an open license by Biblica, Inc.