Jeremaya 25:29
Jeremiah 25:29 · Biblica® Open Igbo Contemporary Bible 2020
Lee, ana m amalite ime ka mbibi bịakwasị obodo ahụ a kpọkwasịrị aha m. Ma unu ga-esi aṅaa gbanarị ahụhụ? Unu agaghị agbanarị ahụhụ, nʼihi na ana m enye iwu ka e webata mma agha nʼetiti ndị niile bi nʼụwa. Otu a ka Onyenwe anyị, Onye pụrụ ime ihe niile kwubiri.’
Jeremiah 25:29 in English
Jeremiah 25:29 · Berean Standard Bible
For behold, I am beginning to bring disaster on the city that bears My Name, so how could you possibly go unpunished? You will not go unpunished, for I am calling down a sword upon all the inhabitants of the earth, declares the LORD of Hosts.’
Context
27“Mgbe ahụ, gwakwa ha sị, ‘Ihe ndị a ka Onyenwe anyị, Onye pụrụ ime ihe niile, bụ Chineke Izrel kwuru: Ṅụọnụ, ṅụbiganụ oke; gbọọkwanụ agbọọ, daanụ nʼala ebe unu na-agaghị esi bilitekwa ọzọ, nʼihi mma agha m ga-ezite nʼetiti unu.’ 28Ọ bụrụ na ha ajụ ịnara gị iko a site na ya ṅụtụ ihe dị ya nʼime, gwa ha sị, ‘Unu ga-aṅụrịrị ya, nʼihi na otu a ka Onyenwe anyị, Onye pụrụ ime ihe niile kwuru. 29Lee, ana m amalite ime ka mbibi bịakwasị obodo ahụ a kpọkwasịrị aha m. Ma unu ga-esi aṅaa gbanarị ahụhụ? Unu agaghị agbanarị ahụhụ, nʼihi na ana m enye iwu ka e webata mma agha nʼetiti ndị niile bi nʼụwa. Otu a ka Onyenwe anyị, Onye pụrụ ime ihe niile kwubiri.’ 30“Ugbu a buo amụma ndị a niile megide ha, sị ha,
“ ‘Onyenwe anyị ga-esi nʼelu bigbọọ;
ọ ga-esitekwa nʼebe obibi ya dị nsọ mee ka olu ya daa ụda.
Ọ ga-ebigbọsị ike megide ala ya
Ọ ga-eti mkpu dịka ndị ahụ na-azọcha mkpụrụ vaịnị;
ọ ga-eti mkpu megide ndị niile bi nʼụwa. 31Ụda mkpọtụ ahụ ga-eru na nsọtụ niile nke ụwa,
nʼihi na Onyenwe anyị ga-ebo mba niile nke ụwa ebubo.
Ọ ga-eme ka ikpe ọmụma rute mmadụ niile,
meekwa ka e jiri mma agha bibie ndị ajọ omume.’ ”
Otu a ka Onyenwe anyị kwubiri.
Igbo text and audio: Biblica® Open Igbo Contemporary Bible™, made available under an open license by Biblica, Inc.