Jeremaya 23:11
Jeremiah 23:11 · Biblica® Open Igbo Contemporary Bible 2020
“Nʼihi na ndị amụma na ndị nchụaja aghọọla ndị na-amaghị Chineke. Ọ bụladị nʼime ụlọnsọ ukwu m ka m na-ahụ ajọ omume ha.” Otu a ka Onyenwe anyị kwupụtara.
Jeremiah 23:11 in English
Jeremiah 23:11 · Berean Standard Bible
“For both prophet and priest are ungodly; even in My house I have found their wickedness,” declares the LORD.
Context
9Ma banyere ndị amụma,
obi m na-agbawa nʼime m,
ọkpụkpụ m na-amakwa jijiji nʼihi ha.
Adị m dịka nwoke mmanya na-egbu,
dịka onye ṅụbigara mmanya oke,
nʼihi ihe na-eche ha site nʼaka Onyenwe anyị,
na site nʼokwu nsọ ya. 10Ndị jupụtara nʼala a bụ ndị na-akwa iko.
Nʼihi ịbụ ọnụ ndị a niile ala a tọgbọrọ nʼefu,
ahịhịa niile dị nʼọzara akpọnwụọla.
Ndị amụma na-agbasokwa ihe ọjọọ.
Ha na-egosikwa ike ha nʼụzọ na-ezighị ezi. 11“Nʼihi na ndị amụma na ndị nchụaja aghọọla ndị na-amaghị Chineke.
Ọ bụladị nʼime ụlọnsọ ukwu m ka m na-ahụ ajọ omume ha.”
Otu a ka Onyenwe anyị kwupụtara. 12“Nʼihi ya, ụzọ ha na-agbaso ga-adị ka ebe na-amị amị;
a ga-achụbanye ha nʼọchịchịrị
ebe ahụ ka ha ga-anọkwa daa.
Aga m eme ka ihe mbibi bịakwasị ha
nʼafọ ahụ, a ga-ata ha ahụhụ.”
Otu a ka Onyenwe anyị kwubiri ya. 13“Ahụrụ m ihe arụ
nʼetiti ndị amụma Sameria:
Ha buru amụma site nʼike chi Baal,
si otu a duba ndị m, bụ Izrel na mmehie.
Igbo text and audio: Biblica® Open Igbo Contemporary Bible™, made available under an open license by Biblica, Inc.