Jeremaya 23:13
Jeremiah 23:13 · Biblica® Open Igbo Contemporary Bible 2020
“Ahụrụ m ihe arụ nʼetiti ndị amụma Sameria: Ha buru amụma site nʼike chi Baal, si otu a duba ndị m, bụ Izrel na mmehie.
Jeremiah 23:13 in English
Jeremiah 23:13 · Berean Standard Bible
“Among the prophets of Samaria I saw an offensive thing: They prophesied by Baal and led My people Israel astray.
Context
11“Nʼihi na ndị amụma na ndị nchụaja aghọọla ndị na-amaghị Chineke.
Ọ bụladị nʼime ụlọnsọ ukwu m ka m na-ahụ ajọ omume ha.”
Otu a ka Onyenwe anyị kwupụtara. 12“Nʼihi ya, ụzọ ha na-agbaso ga-adị ka ebe na-amị amị;
a ga-achụbanye ha nʼọchịchịrị
ebe ahụ ka ha ga-anọkwa daa.
Aga m eme ka ihe mbibi bịakwasị ha
nʼafọ ahụ, a ga-ata ha ahụhụ.”
Otu a ka Onyenwe anyị kwubiri ya. 13“Ahụrụ m ihe arụ
nʼetiti ndị amụma Sameria:
Ha buru amụma site nʼike chi Baal,
si otu a duba ndị m, bụ Izrel na mmehie. 14Ahụkwara m ihe jọgburu onwe ya
nʼetiti ndị amụma nọ na Jerusalem.
Ha na-ebi ndụ ịkwa iko, na ikwu okwu ụgha.
Ha na-agba ndị ajọ omume ume,
si otu a na-egbochi ha isi nʼihe ọjọọ ha tụgharịa.
Ha niile dịka ndị Sọdọm nʼebe m nọ;
ndị Jerusalem dịkwa ka ndị Gọmọra nʼihu m.” 15Nʼihi nke a, ihe ndị a ka Onyenwe anyị, Onye pụrụ ime ihe niile kwuru banyere ndị amụma a,
“Aga m eme ka ha rie nri na-akụ ilu,
meekwa ka ha ṅụọ mmiri e tinyere nsi,
nʼihi na mmụọ nke amaghị Chineke esitela nʼaka ndị amụma nọ na Jerusalem
gbasaa ruo ndị niile bi nʼala ahụ.”
Igbo text and audio: Biblica® Open Igbo Contemporary Bible™, made available under an open license by Biblica, Inc.