Jeremaya 23:14
Jeremiah 23:14 · Biblica® Open Igbo Contemporary Bible 2020
Ahụkwara m ihe jọgburu onwe ya nʼetiti ndị amụma nọ na Jerusalem. Ha na-ebi ndụ ịkwa iko, na ikwu okwu ụgha. Ha na-agba ndị ajọ omume ume, si otu a na-egbochi ha isi nʼihe ọjọọ ha tụgharịa. Ha niile dịka ndị Sọdọm nʼebe m nọ; ndị Jerusalem dịkwa ka ndị Gọmọra nʼihu m.”
Jeremiah 23:14 in English
Jeremiah 23:14 · Berean Standard Bible
And among the prophets of Jerusalem I have seen a horrible thing: They commit adultery and walk in lies. They strengthen the hands of evildoers, so that no one turns his back on wickedness. They are all like Sodom to Me; the people of Jerusalem are like Gomorrah.”
Context
12“Nʼihi ya, ụzọ ha na-agbaso ga-adị ka ebe na-amị amị;
a ga-achụbanye ha nʼọchịchịrị
ebe ahụ ka ha ga-anọkwa daa.
Aga m eme ka ihe mbibi bịakwasị ha
nʼafọ ahụ, a ga-ata ha ahụhụ.”
Otu a ka Onyenwe anyị kwubiri ya. 13“Ahụrụ m ihe arụ
nʼetiti ndị amụma Sameria:
Ha buru amụma site nʼike chi Baal,
si otu a duba ndị m, bụ Izrel na mmehie. 14Ahụkwara m ihe jọgburu onwe ya
nʼetiti ndị amụma nọ na Jerusalem.
Ha na-ebi ndụ ịkwa iko, na ikwu okwu ụgha.
Ha na-agba ndị ajọ omume ume,
si otu a na-egbochi ha isi nʼihe ọjọọ ha tụgharịa.
Ha niile dịka ndị Sọdọm nʼebe m nọ;
ndị Jerusalem dịkwa ka ndị Gọmọra nʼihu m.” 15Nʼihi nke a, ihe ndị a ka Onyenwe anyị, Onye pụrụ ime ihe niile kwuru banyere ndị amụma a,
“Aga m eme ka ha rie nri na-akụ ilu,
meekwa ka ha ṅụọ mmiri e tinyere nsi,
nʼihi na mmụọ nke amaghị Chineke esitela nʼaka ndị amụma nọ na Jerusalem
gbasaa ruo ndị niile bi nʼala ahụ.” 16Ihe ndị a ka Onyenwe anyị, Onye pụrụ ime ihe niile kwuru,
“Unu aṅala ntị nʼihe ndị amụma ahụ na-eburu unu nʼamụma,
nʼihi na olileanya ha na-ewetara unu abụghị ezi olileanya.
Ọhụ ha na-agwa unu na ha hụrụ bụ ihe ha chepụtara nʼobi ha,
o sighị nʼọnụ Onyenwe anyị rute ha
Igbo text and audio: Biblica® Open Igbo Contemporary Bible™, made available under an open license by Biblica, Inc.