Jeremaya 23:16
Jeremiah 23:16 · Biblica® Open Igbo Contemporary Bible 2020
Ihe ndị a ka Onyenwe anyị, Onye pụrụ ime ihe niile kwuru, “Unu aṅala ntị nʼihe ndị amụma ahụ na-eburu unu nʼamụma, nʼihi na olileanya ha na-ewetara unu abụghị ezi olileanya. Ọhụ ha na-agwa unu na ha hụrụ bụ ihe ha chepụtara nʼobi ha, o sighị nʼọnụ Onyenwe anyị rute ha
Jeremiah 23:16 in English
Jeremiah 23:16 · Berean Standard Bible
This is what the LORD of Hosts says: “Do not listen to the words of the prophets who prophesy to you. They are filling you with false hopes. They speak visions from their own minds, not from the mouth of the LORD.
Context
14Ahụkwara m ihe jọgburu onwe ya
nʼetiti ndị amụma nọ na Jerusalem.
Ha na-ebi ndụ ịkwa iko, na ikwu okwu ụgha.
Ha na-agba ndị ajọ omume ume,
si otu a na-egbochi ha isi nʼihe ọjọọ ha tụgharịa.
Ha niile dịka ndị Sọdọm nʼebe m nọ;
ndị Jerusalem dịkwa ka ndị Gọmọra nʼihu m.” 15Nʼihi nke a, ihe ndị a ka Onyenwe anyị, Onye pụrụ ime ihe niile kwuru banyere ndị amụma a,
“Aga m eme ka ha rie nri na-akụ ilu,
meekwa ka ha ṅụọ mmiri e tinyere nsi,
nʼihi na mmụọ nke amaghị Chineke esitela nʼaka ndị amụma nọ na Jerusalem
gbasaa ruo ndị niile bi nʼala ahụ.” 16Ihe ndị a ka Onyenwe anyị, Onye pụrụ ime ihe niile kwuru,
“Unu aṅala ntị nʼihe ndị amụma ahụ na-eburu unu nʼamụma,
nʼihi na olileanya ha na-ewetara unu abụghị ezi olileanya.
Ọhụ ha na-agwa unu na ha hụrụ bụ ihe ha chepụtara nʼobi ha,
o sighị nʼọnụ Onyenwe anyị rute ha 17Ha na-anọgide na-agwa ndị ahụ na-elelị m anya na-asị ha,
‘Onyenwe anyị kwuru sị, unu ga-enwe udo.’
Ndị ahụ niile na-agbasokwa ụzọ isiike nke obi ha tụpụtara,
ka ha na-agwakwa okwu sị, ‘O nweghị ihe ọjọọ ga-abịakwasị gị.’ 18Ma olee onye ọ bụ nʼetiti ndị amụma a nke na-abịaru Onyenwe anyị nso,
hụ ya anya maọbụ ịnụ ihe ọ na-ekwu?
Onye kwa nʼetiti ha nwerela ike ṅaa ntị nụrụ okwu ya?
Igbo text and audio: Biblica® Open Igbo Contemporary Bible™, made available under an open license by Biblica, Inc.