Jeremaya 23:17
Jeremiah 23:17 · Biblica® Open Igbo Contemporary Bible 2020
Ha na-anọgide na-agwa ndị ahụ na-elelị m anya na-asị ha, ‘Onyenwe anyị kwuru sị, unu ga-enwe udo.’ Ndị ahụ niile na-agbasokwa ụzọ isiike nke obi ha tụpụtara, ka ha na-agwakwa okwu sị, ‘O nweghị ihe ọjọọ ga-abịakwasị gị.’
Jeremiah 23:17 in English
Jeremiah 23:17 · Berean Standard Bible
They keep saying to those who despise Me, ‘The LORD says that you will have peace,’ and to everyone who walks in the stubbornness of his own heart, ‘No harm will come to you.’
Context
15Nʼihi nke a, ihe ndị a ka Onyenwe anyị, Onye pụrụ ime ihe niile kwuru banyere ndị amụma a,
“Aga m eme ka ha rie nri na-akụ ilu,
meekwa ka ha ṅụọ mmiri e tinyere nsi,
nʼihi na mmụọ nke amaghị Chineke esitela nʼaka ndị amụma nọ na Jerusalem
gbasaa ruo ndị niile bi nʼala ahụ.” 16Ihe ndị a ka Onyenwe anyị, Onye pụrụ ime ihe niile kwuru,
“Unu aṅala ntị nʼihe ndị amụma ahụ na-eburu unu nʼamụma,
nʼihi na olileanya ha na-ewetara unu abụghị ezi olileanya.
Ọhụ ha na-agwa unu na ha hụrụ bụ ihe ha chepụtara nʼobi ha,
o sighị nʼọnụ Onyenwe anyị rute ha 17Ha na-anọgide na-agwa ndị ahụ na-elelị m anya na-asị ha,
‘Onyenwe anyị kwuru sị, unu ga-enwe udo.’
Ndị ahụ niile na-agbasokwa ụzọ isiike nke obi ha tụpụtara,
ka ha na-agwakwa okwu sị, ‘O nweghị ihe ọjọọ ga-abịakwasị gị.’ 18Ma olee onye ọ bụ nʼetiti ndị amụma a nke na-abịaru Onyenwe anyị nso,
hụ ya anya maọbụ ịnụ ihe ọ na-ekwu?
Onye kwa nʼetiti ha nwerela ike ṅaa ntị nụrụ okwu ya? 19Lee, Onyenwe anyị na-ezite oke ifufe na-efesi ike,
ọ bụ oke ifufe nke iwe ya,
nke ga-abịa
bufuo ndị ajọ omume a.
Igbo text and audio: Biblica® Open Igbo Contemporary Bible™, made available under an open license by Biblica, Inc.