Jeremaya 23:19
Jeremiah 23:19 · Biblica® Open Igbo Contemporary Bible 2020
Lee, Onyenwe anyị na-ezite oke ifufe na-efesi ike, ọ bụ oke ifufe nke iwe ya, nke ga-abịa bufuo ndị ajọ omume a.
Jeremiah 23:19 in English
Jeremiah 23:19 · Berean Standard Bible
Behold, the storm of the LORD has gone out with fury, a whirlwind swirling down upon the heads of the wicked.
Context
17Ha na-anọgide na-agwa ndị ahụ na-elelị m anya na-asị ha,
‘Onyenwe anyị kwuru sị, unu ga-enwe udo.’
Ndị ahụ niile na-agbasokwa ụzọ isiike nke obi ha tụpụtara,
ka ha na-agwakwa okwu sị, ‘O nweghị ihe ọjọọ ga-abịakwasị gị.’ 18Ma olee onye ọ bụ nʼetiti ndị amụma a nke na-abịaru Onyenwe anyị nso,
hụ ya anya maọbụ ịnụ ihe ọ na-ekwu?
Onye kwa nʼetiti ha nwerela ike ṅaa ntị nụrụ okwu ya? 19Lee, Onyenwe anyị na-ezite oke ifufe na-efesi ike,
ọ bụ oke ifufe nke iwe ya,
nke ga-abịa
bufuo ndị ajọ omume a. 20Onyenwe anyị agaghị akwụsị iwe iwe ya
tutu ruo mgbe o mezuru
ihe niile dị ya nʼobi.
Nʼụbọchị ndị ahụ na-abịa nʼihu,
unu ga-aghọta ihe ndị a niile nke ọma. 21Ọ bụghị m zitere ndị amụma a,
ma ha na-ekwu na ọ bụ okwu si m nʼọnụ ka ha na-ekwu.
O nwebeghị oge m ji gwa ha okwu,
ma ha nọkwa na-ebu amụma.
Igbo text and audio: Biblica® Open Igbo Contemporary Bible™, made available under an open license by Biblica, Inc.