Jeremaya 23:21
Jeremiah 23:21 · Biblica® Open Igbo Contemporary Bible 2020
Ọ bụghị m zitere ndị amụma a, ma ha na-ekwu na ọ bụ okwu si m nʼọnụ ka ha na-ekwu. O nwebeghị oge m ji gwa ha okwu, ma ha nọkwa na-ebu amụma.
Jeremiah 23:21 in English
Jeremiah 23:21 · Berean Standard Bible
I did not send these prophets, yet they have run with their message; I did not speak to them, yet they have prophesied.
Context
19Lee, Onyenwe anyị na-ezite oke ifufe na-efesi ike,
ọ bụ oke ifufe nke iwe ya,
nke ga-abịa
bufuo ndị ajọ omume a. 20Onyenwe anyị agaghị akwụsị iwe iwe ya
tutu ruo mgbe o mezuru
ihe niile dị ya nʼobi.
Nʼụbọchị ndị ahụ na-abịa nʼihu,
unu ga-aghọta ihe ndị a niile nke ọma. 21Ọ bụghị m zitere ndị amụma a,
ma ha na-ekwu na ọ bụ okwu si m nʼọnụ ka ha na-ekwu.
O nwebeghị oge m ji gwa ha okwu,
ma ha nọkwa na-ebu amụma. 22A sị na ha abịala nso guzo nʼebe ịgba izu nzuzo m,
ha gaara ekwusara ndị m okwu m,
nke gaara eme ka ha site nʼajọ omume ha tụgharịa,
sitekwa nʼụzọ ọjọọ ha chigharịa. 23“Abụ m naanị Chineke na-anọ ha nso,
ma adịghị m anọ nʼebe dị anya?”
Otu a ka Onyenwe anyị kwupụtara.
Igbo text and audio: Biblica® Open Igbo Contemporary Bible™, made available under an open license by Biblica, Inc.