Jeremaya 23:10
Jeremiah 23:10 · Biblica® Open Igbo Contemporary Bible 2020
Ndị jupụtara nʼala a bụ ndị na-akwa iko. Nʼihi ịbụ ọnụ ndị a niile ala a tọgbọrọ nʼefu, ahịhịa niile dị nʼọzara akpọnwụọla. Ndị amụma na-agbasokwa ihe ọjọọ. Ha na-egosikwa ike ha nʼụzọ na-ezighị ezi.
Jeremiah 23:10 in English
Jeremiah 23:10 · Berean Standard Bible
For the land is full of adulterers— because of the curse, the land mourns and the pastures of the wilderness have dried up— their course is evil and their power is misused.
Context
8ma ha ga-asị, ‘Dịka Onyenwe anyị na-adị ndụ, bụ onye ahụ kpọlatara agbụrụ Izrel site nʼala dị nʼugwu, na mba dị iche iche ebe ọ chụgara ha.’ Mgbe ahụ, ha ga-ebi nʼala nke aka ha.” 9Ma banyere ndị amụma,
obi m na-agbawa nʼime m,
ọkpụkpụ m na-amakwa jijiji nʼihi ha.
Adị m dịka nwoke mmanya na-egbu,
dịka onye ṅụbigara mmanya oke,
nʼihi ihe na-eche ha site nʼaka Onyenwe anyị,
na site nʼokwu nsọ ya. 10Ndị jupụtara nʼala a bụ ndị na-akwa iko.
Nʼihi ịbụ ọnụ ndị a niile ala a tọgbọrọ nʼefu,
ahịhịa niile dị nʼọzara akpọnwụọla.
Ndị amụma na-agbasokwa ihe ọjọọ.
Ha na-egosikwa ike ha nʼụzọ na-ezighị ezi. 11“Nʼihi na ndị amụma na ndị nchụaja aghọọla ndị na-amaghị Chineke.
Ọ bụladị nʼime ụlọnsọ ukwu m ka m na-ahụ ajọ omume ha.”
Otu a ka Onyenwe anyị kwupụtara. 12“Nʼihi ya, ụzọ ha na-agbaso ga-adị ka ebe na-amị amị;
a ga-achụbanye ha nʼọchịchịrị
ebe ahụ ka ha ga-anọkwa daa.
Aga m eme ka ihe mbibi bịakwasị ha
nʼafọ ahụ, a ga-ata ha ahụhụ.”
Otu a ka Onyenwe anyị kwubiri ya.
Igbo text and audio: Biblica® Open Igbo Contemporary Bible™, made available under an open license by Biblica, Inc.