Jeremaya 22:12
Jeremiah 22:12 · Biblica® Open Igbo Contemporary Bible 2020
Ebe ahụ e buuru ya gaa ka ọ ga-anọ nwụọ. Ọ gaghị ahụkwa ala nke aka ya anya ọzọ.”
Jeremiah 22:12 in English
Jeremiah 22:12 · Berean Standard Bible
but he will die in the place to which he was exiled; he will never see this land again.”
Context
10Unu akwala akwa nʼihi eze ahụ nwụrụ anwụ, maọbụ ruo ụjụ nʼihi na ọ gaghị abụkwa eze unu,
kama kwaanụ akwa nʼihi onye ahụ a dọtara nʼagha buru gaa mba ọzọ.
Nʼihi na ọ gaghị alọghachi ọzọ;
ọ gaghị ahụkwa ala ebe a mụrụ ya anya ọzọ. 11Nʼihi na ihe ndị a ka Onyenwe anyị kwuru banyere Shalum nwa Josaya, onye nọchiri anya nna ya dịka eze Juda, bụ onye ahụ e si nʼebe a buru gaa mba ọzọ, “Ọ gaghị alọtakwa ọzọ. 12Ebe ahụ e buuru ya gaa ka ọ ga-anọ nwụọ. Ọ gaghị ahụkwa ala nke aka ya anya ọzọ.” 13“Ahụhụ na-adịrị onye ahụ na-ewu ụlọeze ya site nʼụzọ ajọ omume,
nke jikwa ikpe na-ezighị ezi na-ewu ime ụlọ elu ya niile,
onye ahụ nke na-eme ndị mmadụ rụọ ọrụ nʼefu,
nke na-adịghị akwụ ha ụgwọ ọbụla nʼihi ọrụ ha. 14Onye na-asị, ‘Aga m ewuru onwe m ụlọeze buru ibu,
nke ọnụụlọ dị nʼụlọ elu ya sara ezi mbara.’
Ya mere, ọ tinyere oghereikuku sara mbara nʼụlọ ahụ,
jirikwa osisi sida machie elu ya,
werekwa penti* na-acha uhie uhie chọọ ya mma.
Igbo text and audio: Biblica® Open Igbo Contemporary Bible™, made available under an open license by Biblica, Inc.