Jeremaya 22:13
Jeremiah 22:13 · Biblica® Open Igbo Contemporary Bible 2020
“Ahụhụ na-adịrị onye ahụ na-ewu ụlọeze ya site nʼụzọ ajọ omume, nke jikwa ikpe na-ezighị ezi na-ewu ime ụlọ elu ya niile, onye ahụ nke na-eme ndị mmadụ rụọ ọrụ nʼefu, nke na-adịghị akwụ ha ụgwọ ọbụla nʼihi ọrụ ha.
Jeremiah 22:13 in English
Jeremiah 22:13 · Berean Standard Bible
“Woe to him who builds his palace by unrighteousness, and his upper rooms without justice, who makes his countrymen serve without pay, and fails to pay their wages,
Context
11Nʼihi na ihe ndị a ka Onyenwe anyị kwuru banyere Shalum nwa Josaya, onye nọchiri anya nna ya dịka eze Juda, bụ onye ahụ e si nʼebe a buru gaa mba ọzọ, “Ọ gaghị alọtakwa ọzọ. 12Ebe ahụ e buuru ya gaa ka ọ ga-anọ nwụọ. Ọ gaghị ahụkwa ala nke aka ya anya ọzọ.” 13“Ahụhụ na-adịrị onye ahụ na-ewu ụlọeze ya site nʼụzọ ajọ omume,
nke jikwa ikpe na-ezighị ezi na-ewu ime ụlọ elu ya niile,
onye ahụ nke na-eme ndị mmadụ rụọ ọrụ nʼefu,
nke na-adịghị akwụ ha ụgwọ ọbụla nʼihi ọrụ ha. 14Onye na-asị, ‘Aga m ewuru onwe m ụlọeze buru ibu,
nke ọnụụlọ dị nʼụlọ elu ya sara ezi mbara.’
Ya mere, ọ tinyere oghereikuku sara mbara nʼụlọ ahụ,
jirikwa osisi sida machie elu ya,
werekwa penti* na-acha uhie uhie chọọ ya mma. 15“Ị ga-abụ eze
nʼihi na i nwere ọtụtụ osisi sida karịa ndị ọzọ?
Nna gị o nweghị ihe oriri na ihe ọṅụṅụ?
O mere ihe dị mma na ihe ziri ezi
nʼihi ya ihe niile gaara ya nke ọma.
Igbo text and audio: Biblica® Open Igbo Contemporary Bible™, made available under an open license by Biblica, Inc.