Jeremaya 22:14
Jeremiah 22:14 · Biblica® Open Igbo Contemporary Bible 2020
Onye na-asị, ‘Aga m ewuru onwe m ụlọeze buru ibu, nke ọnụụlọ dị nʼụlọ elu ya sara ezi mbara.’ Ya mere, ọ tinyere oghereikuku sara mbara nʼụlọ ahụ, jirikwa osisi sida machie elu ya, werekwa penti* na-acha uhie uhie chọọ ya mma.
Jeremiah 22:14 in English
Jeremiah 22:14 · Berean Standard Bible
who says, ‘I will build myself a great palace, with spacious upper rooms.’ So he cuts windows in it, panels it with cedar, and paints it with vermilion.
Context
12Ebe ahụ e buuru ya gaa ka ọ ga-anọ nwụọ. Ọ gaghị ahụkwa ala nke aka ya anya ọzọ.” 13“Ahụhụ na-adịrị onye ahụ na-ewu ụlọeze ya site nʼụzọ ajọ omume,
nke jikwa ikpe na-ezighị ezi na-ewu ime ụlọ elu ya niile,
onye ahụ nke na-eme ndị mmadụ rụọ ọrụ nʼefu,
nke na-adịghị akwụ ha ụgwọ ọbụla nʼihi ọrụ ha. 14Onye na-asị, ‘Aga m ewuru onwe m ụlọeze buru ibu,
nke ọnụụlọ dị nʼụlọ elu ya sara ezi mbara.’
Ya mere, ọ tinyere oghereikuku sara mbara nʼụlọ ahụ,
jirikwa osisi sida machie elu ya,
werekwa penti* na-acha uhie uhie chọọ ya mma. 15“Ị ga-abụ eze
nʼihi na i nwere ọtụtụ osisi sida karịa ndị ọzọ?
Nna gị o nweghị ihe oriri na ihe ọṅụṅụ?
O mere ihe dị mma na ihe ziri ezi
nʼihi ya ihe niile gaara ya nke ọma. 16O kwuchitere ọnụ ndị ogbenye na ndị nọ na mkpa,
nke a mere na ihe niile gara nke ọma.
Ọ bụghị nke a bụ ihe ọ pụtara bụ ịmara m?
Ka Onyenwe anyị kwupụtara
Igbo text and audio: Biblica® Open Igbo Contemporary Bible™, made available under an open license by Biblica, Inc.