Native Bible

Jeremiah 22:15 · Biblica® Open Igbo Contemporary Bible 2020

“Ị ga-abụ eze nʼihi na i nwere ọtụtụ osisi sida karịa ndị ọzọ? Nna gị o nweghị ihe oriri na ihe ọṅụṅụ? O mere ihe dị mma na ihe ziri ezi nʼihi ya ihe niile gaara ya nke ọma.

Jeremiah 22:15 in English

Jeremiah 22:15 · Berean Standard Bible

Does it make you a king to excel * in cedar? Did not your father have food and drink? He administered justice and righteousness, and so it went well with him.

Context

13“Ahụhụ na-adịrị onye ahụ na-ewu ụlọeze ya site nʼụzọ ajọ omume, nke jikwa ikpe na-ezighị ezi na-ewu ime ụlọ elu ya niile, onye ahụ nke na-eme ndị mmadụ rụọ ọrụ nʼefu, nke na-adịghị akwụ ha ụgwọ ọbụla nʼihi ọrụ ha. 14Onye na-asị, ‘Aga m ewuru onwe m ụlọeze buru ibu, nke ọnụụlọ dị nʼụlọ elu ya sara ezi mbara.’ Ya mere, ọ tinyere oghereikuku sara mbara nʼụlọ ahụ, jirikwa osisi sida machie elu ya, werekwa penti* na-acha uhie uhie chọọ ya mma. 15“Ị ga-abụ eze nʼihi na i nwere ọtụtụ osisi sida karịa ndị ọzọ? Nna gị o nweghị ihe oriri na ihe ọṅụṅụ? O mere ihe dị mma na ihe ziri ezi nʼihi ya ihe niile gaara ya nke ọma. 16O kwuchitere ọnụ ndị ogbenye na ndị nọ na mkpa, nke a mere na ihe niile gara nke ọma. Ọ bụghị nke a bụ ihe ọ pụtara bụ ịmara m? Ka Onyenwe anyị kwupụtara 17Ma anya unu na obi unu adịghị nʼihe ọzọ ma ọ bụghị naanị nʼuru nʼezighị ezi nʼiwufu ọbara ndị aka ha dị ọcha, na imegbu ndị mmadụ, na iji aka ike pụnara ha ihe ha nwere.”

Igbo text and audio: Biblica® Open Igbo Contemporary Bible™, made available under an open license by Biblica, Inc.