Jeremaya 22:15
Jeremiah 22:15 · Biblica® Open Igbo Contemporary Bible 2020
“Ị ga-abụ eze nʼihi na i nwere ọtụtụ osisi sida karịa ndị ọzọ? Nna gị o nweghị ihe oriri na ihe ọṅụṅụ? O mere ihe dị mma na ihe ziri ezi nʼihi ya ihe niile gaara ya nke ọma.
Jeremiah 22:15 in English
Jeremiah 22:15 · Berean Standard Bible
Does it make you a king to excel * in cedar? Did not your father have food and drink? He administered justice and righteousness, and so it went well with him.
Context
13“Ahụhụ na-adịrị onye ahụ na-ewu ụlọeze ya site nʼụzọ ajọ omume,
nke jikwa ikpe na-ezighị ezi na-ewu ime ụlọ elu ya niile,
onye ahụ nke na-eme ndị mmadụ rụọ ọrụ nʼefu,
nke na-adịghị akwụ ha ụgwọ ọbụla nʼihi ọrụ ha. 14Onye na-asị, ‘Aga m ewuru onwe m ụlọeze buru ibu,
nke ọnụụlọ dị nʼụlọ elu ya sara ezi mbara.’
Ya mere, ọ tinyere oghereikuku sara mbara nʼụlọ ahụ,
jirikwa osisi sida machie elu ya,
werekwa penti* na-acha uhie uhie chọọ ya mma. 15“Ị ga-abụ eze
nʼihi na i nwere ọtụtụ osisi sida karịa ndị ọzọ?
Nna gị o nweghị ihe oriri na ihe ọṅụṅụ?
O mere ihe dị mma na ihe ziri ezi
nʼihi ya ihe niile gaara ya nke ọma. 16O kwuchitere ọnụ ndị ogbenye na ndị nọ na mkpa,
nke a mere na ihe niile gara nke ọma.
Ọ bụghị nke a bụ ihe ọ pụtara bụ ịmara m?
Ka Onyenwe anyị kwupụtara 17Ma anya unu na obi unu
adịghị nʼihe ọzọ ma ọ bụghị naanị nʼuru nʼezighị ezi
nʼiwufu ọbara ndị aka ha dị ọcha,
na imegbu ndị mmadụ, na iji aka ike pụnara ha ihe ha nwere.”
Igbo text and audio: Biblica® Open Igbo Contemporary Bible™, made available under an open license by Biblica, Inc.