Jeremaya 2:27
Jeremiah 2:27 · Biblica® Open Igbo Contemporary Bible 2020
Ha na-asị osisi, ‘Nna m ka ị bụ,’ na-asịkwa nkume, ‘Ọ bụ gị mụrụ m.’ Ha agbakụtala m azụ, jụ iche m ihu. Ma mgbe ọbụla nsogbu bịakwasịrị ha, ha na-asị, ‘Bịa, zọpụta anyị.’
Jeremiah 2:27 in English
Jeremiah 2:27 · Berean Standard Bible
say to a tree, ‘You are my father,’ and to a stone, ‘You gave me birth.’ For they have turned their backs to Me and not their faces, yet in the time of trouble they beg, ‘Rise up and save us!’
Context
25Agbala ọsọ ruo mgbe ị ga-agbara ụkwụ efu,
mgbe akpịrị ga-akpọ gị nku.
Ma ị na-asị, ‘O nweghị uru ọ bara.
Nʼihi na ahụrụ m chi ndị mba ọzọ nʼanya,
aghaghị m ịgbaso ha.’ 26“Dịka a na-eme onye ohi ihe ihere mgbe e jidere ya,
otu a ka a ga-eme ụlọ Izrel ihere,
ha onwe ha, ma ndị eze ha, ma ndịisi ha,
ndị nchụaja ha na ndị amụma ha. 27Ha na-asị osisi, ‘Nna m ka ị bụ,’
na-asịkwa nkume, ‘Ọ bụ gị mụrụ m.’
Ha agbakụtala m azụ,
jụ iche m ihu.
Ma mgbe ọbụla nsogbu bịakwasịrị ha, ha na-asị,
‘Bịa, zọpụta anyị.’ 28Olee ebe chi ndị ahụ i meere nye onwe gị nọ?
Ka ha bịa, ma ọ bụrụ na ha nwere ike ịzọpụta gị,
mgbe nsogbu bịakwasịrị unu.
Nʼihi na gị, bụ Juda, nwere ọtụtụ chi
dịka i si nwee ọtụtụ obodo. 29“Gịnị mere unu ji ekwu okwu ebubo megide m?
Unu niile enupula isi megide m,”
ka Onyenwe anyị kwupụtara.
Igbo text and audio: Biblica® Open Igbo Contemporary Bible™, made available under an open license by Biblica, Inc.