Native Bible

Jeremiah 2:26 · Biblica® Open Igbo Contemporary Bible 2020

“Dịka a na-eme onye ohi ihe ihere mgbe e jidere ya, otu a ka a ga-eme ụlọ Izrel ihere, ha onwe ha, ma ndị eze ha, ma ndịisi ha, ndị nchụaja ha na ndị amụma ha.

Jeremiah 2:26 in English

Jeremiah 2:26 · Berean Standard Bible

As the thief is ashamed when he is caught, so the house of Israel is disgraced. They, their kings, their officials, their priests, and their prophets

Context

24Nne ịnyịnya ibu ọhịa nke mara ụzọ ya nke ọma nʼọzara, na-esi imi ma ọ ga-esichapụta oke ịnyịnya ibu, onye pụrụ igbochi ya nʼoge mmekọ ya na oke ịnyịnya zuru? Oke ịnyịnya ọbụla chọọrọ ya agaghị atụfu oge nʼịchụgharị ya, nʼihi nʼoge ha chọrọ mmekọ, ha ga-achọta ya. 25Agbala ọsọ ruo mgbe ị ga-agbara ụkwụ efu, mgbe akpịrị ga-akpọ gị nku. Ma ị na-asị, ‘O nweghị uru ọ bara. Nʼihi na ahụrụ m chi ndị mba ọzọ nʼanya, aghaghị m ịgbaso ha.’ 26“Dịka a na-eme onye ohi ihe ihere mgbe e jidere ya, otu a ka a ga-eme ụlọ Izrel ihere, ha onwe ha, ma ndị eze ha, ma ndịisi ha, ndị nchụaja ha na ndị amụma ha. 27Ha na-asị osisi, ‘Nna m ka ị bụ,’ na-asịkwa nkume, ‘Ọ bụ gị mụrụ m.’ Ha agbakụtala m azụ, jụ iche m ihu. Ma mgbe ọbụla nsogbu bịakwasịrị ha, ha na-asị, ‘Bịa, zọpụta anyị.’ 28Olee ebe chi ndị ahụ i meere nye onwe gị nọ? Ka ha bịa, ma ọ bụrụ na ha nwere ike ịzọpụta gị, mgbe nsogbu bịakwasịrị unu. Nʼihi na gị, bụ Juda, nwere ọtụtụ chi dịka i si nwee ọtụtụ obodo.

Igbo text and audio: Biblica® Open Igbo Contemporary Bible™, made available under an open license by Biblica, Inc.