Native Bible

Jeremiah 2:29 · Biblica® Open Igbo Contemporary Bible 2020

“Gịnị mere unu ji ekwu okwu ebubo megide m? Unu niile enupula isi megide m,” ka Onyenwe anyị kwupụtara.

Jeremiah 2:29 in English

Jeremiah 2:29 · Berean Standard Bible

Why do you bring a case against Me? You have all rebelled against Me,” declares the LORD.

Context

27Ha na-asị osisi, ‘Nna m ka ị bụ,’ na-asịkwa nkume, ‘Ọ bụ gị mụrụ m.’ Ha agbakụtala m azụ, jụ iche m ihu. Ma mgbe ọbụla nsogbu bịakwasịrị ha, ha na-asị, ‘Bịa, zọpụta anyị.’ 28Olee ebe chi ndị ahụ i meere nye onwe gị nọ? Ka ha bịa, ma ọ bụrụ na ha nwere ike ịzọpụta gị, mgbe nsogbu bịakwasịrị unu. Nʼihi na gị, bụ Juda, nwere ọtụtụ chi dịka i si nwee ọtụtụ obodo. 29“Gịnị mere unu ji ekwu okwu ebubo megide m? Unu niile enupula isi megide m,” ka Onyenwe anyị kwupụtara. 30“Nʼefu ka m tiri ụmụ unu ihe; ma nke a emeghị ka ha nabata ịdọ aka na ntị. Dịka ọdụm na-adọgbu anụ, mma agha unu eripịala ndị amụma unu. 31“Unu ndị ọgbọ a, tuleenụ okwu nke Onyenwe anyị: “O nweela mgbe m bụ ọzara nye ndị Izrel ma ọ bụkwanụ ala gbara oke ọchịchịrị? Gịnị mekwaranụ ndị m ji na-asị, ‘Anyị enwerela onwe anyị ịwagharị, anyị agaghị abịakwutekwa gị ọzọ’?

Igbo text and audio: Biblica® Open Igbo Contemporary Bible™, made available under an open license by Biblica, Inc.