Jeremaya 2:31
Jeremiah 2:31 · Biblica® Open Igbo Contemporary Bible 2020
“Unu ndị ọgbọ a, tuleenụ okwu nke Onyenwe anyị: “O nweela mgbe m bụ ọzara nye ndị Izrel ma ọ bụkwanụ ala gbara oke ọchịchịrị? Gịnị mekwaranụ ndị m ji na-asị, ‘Anyị enwerela onwe anyị ịwagharị, anyị agaghị abịakwutekwa gị ọzọ’?
Jeremiah 2:31 in English
Jeremiah 2:31 · Berean Standard Bible
You people of this generation, consider the word of the LORD: “Have I been a wilderness to Israel or a land of dense darkness? Why do My people say, ‘We are free to roam; we will come to You no more’?
Context
29“Gịnị mere unu ji ekwu okwu ebubo megide m?
Unu niile enupula isi megide m,”
ka Onyenwe anyị kwupụtara. 30“Nʼefu ka m tiri ụmụ unu ihe;
ma nke a emeghị ka ha nabata ịdọ aka na ntị.
Dịka ọdụm na-adọgbu anụ,
mma agha unu eripịala ndị amụma unu. 31“Unu ndị ọgbọ a, tuleenụ okwu nke Onyenwe anyị:
“O nweela mgbe m bụ ọzara nye ndị Izrel
ma ọ bụkwanụ ala gbara oke ọchịchịrị?
Gịnị mekwaranụ ndị m ji na-asị, ‘Anyị enwerela onwe anyị ịwagharị,
anyị agaghị abịakwutekwa gị ọzọ’? 32Nwaagbọghọ ọ na-echefu ọla ịchọ mma ya,
nwanyị a na-alụ ọhụrụ ọ na-echefu ngwa ịchọ mma ya?
Ma nʼime ọtụtụ ụbọchị nke a na-apụghị ịgụta ọnụ,
ndị m echefuola m. 33Lee ka unu si bụrụ ndị ọka nʼịgbaso ịhụnanya.
Ọ bụladị ụmụ nwanyị dị njọ karịsịa nwere ike ịmụta ihe site nʼụzọ unu.
Igbo text and audio: Biblica® Open Igbo Contemporary Bible™, made available under an open license by Biblica, Inc.