Jeremaya 2:32
Jeremiah 2:32 · Biblica® Open Igbo Contemporary Bible 2020
Nwaagbọghọ ọ na-echefu ọla ịchọ mma ya, nwanyị a na-alụ ọhụrụ ọ na-echefu ngwa ịchọ mma ya? Ma nʼime ọtụtụ ụbọchị nke a na-apụghị ịgụta ọnụ, ndị m echefuola m.
Jeremiah 2:32 in English
Jeremiah 2:32 · Berean Standard Bible
Does a maiden forget her jewelry or a bride her wedding sash? Yet My people have forgotten Me for days without number.
Context
30“Nʼefu ka m tiri ụmụ unu ihe;
ma nke a emeghị ka ha nabata ịdọ aka na ntị.
Dịka ọdụm na-adọgbu anụ,
mma agha unu eripịala ndị amụma unu. 31“Unu ndị ọgbọ a, tuleenụ okwu nke Onyenwe anyị:
“O nweela mgbe m bụ ọzara nye ndị Izrel
ma ọ bụkwanụ ala gbara oke ọchịchịrị?
Gịnị mekwaranụ ndị m ji na-asị, ‘Anyị enwerela onwe anyị ịwagharị,
anyị agaghị abịakwutekwa gị ọzọ’? 32Nwaagbọghọ ọ na-echefu ọla ịchọ mma ya,
nwanyị a na-alụ ọhụrụ ọ na-echefu ngwa ịchọ mma ya?
Ma nʼime ọtụtụ ụbọchị nke a na-apụghị ịgụta ọnụ,
ndị m echefuola m. 33Lee ka unu si bụrụ ndị ọka nʼịgbaso ịhụnanya.
Ọ bụladị ụmụ nwanyị dị njọ karịsịa nwere ike ịmụta ihe site nʼụzọ unu. 34Nʼuwe unu ka achọtara ọbara
ndị ogbenye na-enweghị ihe ọjọọ ha mere,
nʼagbanyeghị na unu ejideghị ha ka ha nʼagbaka ụzọ.
Ma unu gara nʼihu
Igbo text and audio: Biblica® Open Igbo Contemporary Bible™, made available under an open license by Biblica, Inc.