Jeremaya 2:34
Jeremiah 2:34 · Biblica® Open Igbo Contemporary Bible 2020
Nʼuwe unu ka achọtara ọbara ndị ogbenye na-enweghị ihe ọjọọ ha mere, nʼagbanyeghị na unu ejideghị ha ka ha nʼagbaka ụzọ. Ma unu gara nʼihu
Jeremiah 2:34 in English
Jeremiah 2:34 · Berean Standard Bible
Moreover, your skirts are stained with the blood of the innocent poor, though you did not find them breaking in. But in spite of all these things
Context
32Nwaagbọghọ ọ na-echefu ọla ịchọ mma ya,
nwanyị a na-alụ ọhụrụ ọ na-echefu ngwa ịchọ mma ya?
Ma nʼime ọtụtụ ụbọchị nke a na-apụghị ịgụta ọnụ,
ndị m echefuola m. 33Lee ka unu si bụrụ ndị ọka nʼịgbaso ịhụnanya.
Ọ bụladị ụmụ nwanyị dị njọ karịsịa nwere ike ịmụta ihe site nʼụzọ unu. 34Nʼuwe unu ka achọtara ọbara
ndị ogbenye na-enweghị ihe ọjọọ ha mere,
nʼagbanyeghị na unu ejideghị ha ka ha nʼagbaka ụzọ.
Ma unu gara nʼihu 35na-asịkwa, ‘Emeghị m ihe ọjọọ,
ọ dịghị eweso m iwe.’
Ma aga m ekpe unu ikpe,
nʼihi na unu na-asị, ‘Emeghị m mmehie.’ 36Gịnị mere unu ji na-akpagharị
na-agbanwe ụzọ unu ọtụtụ mgbe?
Ijipt ga-etinye unu nʼọnọdụ ihere
dịka ndị Asịrịa mere unu.
Igbo text and audio: Biblica® Open Igbo Contemporary Bible™, made available under an open license by Biblica, Inc.