Jeremaya 2:35
Jeremiah 2:35 · Biblica® Open Igbo Contemporary Bible 2020
na-asịkwa, ‘Emeghị m ihe ọjọọ, ọ dịghị eweso m iwe.’ Ma aga m ekpe unu ikpe, nʼihi na unu na-asị, ‘Emeghị m mmehie.’
Jeremiah 2:35 in English
Jeremiah 2:35 · Berean Standard Bible
you say, ‘I am innocent. Surely His anger will turn from me.’ Behold, I will judge you, because you say, ‘I have not sinned.’
Context
33Lee ka unu si bụrụ ndị ọka nʼịgbaso ịhụnanya.
Ọ bụladị ụmụ nwanyị dị njọ karịsịa nwere ike ịmụta ihe site nʼụzọ unu. 34Nʼuwe unu ka achọtara ọbara
ndị ogbenye na-enweghị ihe ọjọọ ha mere,
nʼagbanyeghị na unu ejideghị ha ka ha nʼagbaka ụzọ.
Ma unu gara nʼihu 35na-asịkwa, ‘Emeghị m ihe ọjọọ,
ọ dịghị eweso m iwe.’
Ma aga m ekpe unu ikpe,
nʼihi na unu na-asị, ‘Emeghị m mmehie.’ 36Gịnị mere unu ji na-akpagharị
na-agbanwe ụzọ unu ọtụtụ mgbe?
Ijipt ga-etinye unu nʼọnọdụ ihere
dịka ndị Asịrịa mere unu. 37Unu ga-ebu aka unu nʼisi
mgbe unu si ebe ahụ na-apụ,
nʼihi na Onyenwe anyị ajụla ndị ahụ unu tụkwasịrị obi.
Ha agaghị enyere unu aka.
2:9 Aga m akpọ unu ikpe.
2:11 Gbanwere Chineke ha dị ebube
2:22 Ya bụ, akanwụ
Igbo text and audio: Biblica® Open Igbo Contemporary Bible™, made available under an open license by Biblica, Inc.