Native Bible

Jeremiah 17:13 · Biblica® Open Igbo Contemporary Bible 2020

Onyenwe anyị, olileanya Izrel ka ị bụ. A ga-emekwa ka ihere mee ndị na-agbakụta gị azụ. A ga-edekwa aha ndị ahụ niile si nʼebe ị nọ wezuga onwe ha nʼala, nʼihi na ha ewezugala onwe ha site nʼebe Onyenwe anyị, isi iyi nke mmiri na-enye ndụ, nọ.

Jeremiah 17:13 in English

Jeremiah 17:13 · Berean Standard Bible

O LORD, the hope of Israel, all who abandon You will be put to shame. All who turn away will be written in the dust, for they have abandoned the LORD, the fountain of living water.

Context

11Dịka ọkwa si ekpokọba akwa ọ na-eyighị, otu a ka ndị na-akpakọba akụ nʼụzọ na-ezighị ezi dị. Nʼetiti ụbọchị ndụ ha, akụ ndị a ga-efunarị ha. Nʼikpeazụ ha ga-aghọ ndị nzuzu. 12Ocheeze dị ebube, nke e mere ka ọ dị elu site na mmalite, ka ebe nsọ anyị bụ. 13Onyenwe anyị, olileanya Izrel ka ị bụ. A ga-emekwa ka ihere mee ndị na-agbakụta gị azụ. A ga-edekwa aha ndị ahụ niile si nʼebe ị nọ wezuga onwe ha nʼala, nʼihi na ha ewezugala onwe ha site nʼebe Onyenwe anyị, isi iyi nke mmiri na-enye ndụ, nọ. 14Onyenwe anyị, ọ bụrụ na i mee ka ahụ sie m ike aga m adị ndụ. Ọ bụrụ na ị zọpụta m aga m abụ onye azọpụtara, nʼihi na ọ bu naanị gị ka m na-eto. 15Ha nọ na-ajụ m ọnụ, na-asị m, “Olee ebe okwu Onyenwe anyị dị? Ya mezuonụ ugbu a!”

Igbo text and audio: Biblica® Open Igbo Contemporary Bible™, made available under an open license by Biblica, Inc.