Jeremaya 17:12
Jeremiah 17:12 · Biblica® Open Igbo Contemporary Bible 2020
Ocheeze dị ebube, nke e mere ka ọ dị elu site na mmalite, ka ebe nsọ anyị bụ.
Jeremiah 17:12 in English
Jeremiah 17:12 · Berean Standard Bible
A glorious throne, exalted from the beginning, is the place of our sanctuary.
Context
10“Mụ onwe m bụ Onyenwe anyị na-enyocha obi,
na-anwụpụta ihe dị nʼime mmụọ,
nʼihi ịkwụ mmadụ ụgwọ dịka ọrụ ya si dị,
na dịka ihe ruuru ya si dị nʼihi ọrụ ya.” 11Dịka ọkwa si ekpokọba akwa ọ na-eyighị,
otu a ka ndị na-akpakọba akụ nʼụzọ na-ezighị ezi dị.
Nʼetiti ụbọchị ndụ ha, akụ ndị a ga-efunarị ha.
Nʼikpeazụ ha ga-aghọ ndị nzuzu. 12Ocheeze dị ebube, nke e mere ka ọ dị elu site na mmalite,
ka ebe nsọ anyị bụ. 13Onyenwe anyị, olileanya Izrel ka ị bụ.
A ga-emekwa ka ihere mee ndị na-agbakụta gị azụ.
A ga-edekwa aha ndị ahụ niile si nʼebe ị nọ wezuga onwe ha nʼala,
nʼihi na ha ewezugala onwe ha site nʼebe Onyenwe anyị,
isi iyi nke mmiri na-enye ndụ, nọ. 14Onyenwe anyị, ọ bụrụ na i mee ka ahụ sie m ike aga m adị ndụ.
Ọ bụrụ na ị zọpụta m aga m abụ onye azọpụtara,
nʼihi na ọ bu naanị gị ka m na-eto.
Igbo text and audio: Biblica® Open Igbo Contemporary Bible™, made available under an open license by Biblica, Inc.