Jeremaya 17:14
Jeremiah 17:14 · Biblica® Open Igbo Contemporary Bible 2020
Onyenwe anyị, ọ bụrụ na i mee ka ahụ sie m ike aga m adị ndụ. Ọ bụrụ na ị zọpụta m aga m abụ onye azọpụtara, nʼihi na ọ bu naanị gị ka m na-eto.
Jeremiah 17:14 in English
Jeremiah 17:14 · Berean Standard Bible
Heal me, O LORD, and I will be healed; save me, and I will be saved, for You are my praise.
Context
12Ocheeze dị ebube, nke e mere ka ọ dị elu site na mmalite,
ka ebe nsọ anyị bụ. 13Onyenwe anyị, olileanya Izrel ka ị bụ.
A ga-emekwa ka ihere mee ndị na-agbakụta gị azụ.
A ga-edekwa aha ndị ahụ niile si nʼebe ị nọ wezuga onwe ha nʼala,
nʼihi na ha ewezugala onwe ha site nʼebe Onyenwe anyị,
isi iyi nke mmiri na-enye ndụ, nọ. 14Onyenwe anyị, ọ bụrụ na i mee ka ahụ sie m ike aga m adị ndụ.
Ọ bụrụ na ị zọpụta m aga m abụ onye azọpụtara,
nʼihi na ọ bu naanị gị ka m na-eto. 15Ha nọ na-ajụ m ọnụ, na-asị m,
“Olee ebe okwu Onyenwe anyị dị?
Ya mezuonụ ugbu a!” 16Ma esitebeghị m na ị bụ onye ọzụzụ atụrụ gị wezuga onwe m.
Ị maara na ọ bụghị ọchịchọ obi m ịhụ ụbọchị ahụ na-eweta ịda mba.
Ị maara ụdị okwu niile na-esite nʼọnụ m na-apụ.
Igbo text and audio: Biblica® Open Igbo Contemporary Bible™, made available under an open license by Biblica, Inc.