Jeremaya 15:9
Jeremiah 15:9 · Biblica® Open Igbo Contemporary Bible 2020
Nwanyị mụrụ ụmụ asaa ga-ada mba, kubie ume. Ọ ga-anwụ mgbe oge ya na-erubeghị, ihere ga-eme ya; ọ ga-abụkwa onye e wedara nʼala. Ma ndị fọdụrụ ndụ ka m ga-eme ka ha nwụọ site na mma agha ndị iro ha.” Otu a ka Onyenwe anyị kwubiri.
Jeremiah 15:9 in English
Jeremiah 15:9 · Berean Standard Bible
The mother of seven will grow faint; she will breathe her last breath. Her sun will set while it is still day; she will be disgraced and humiliated. And the rest I will put to the sword in the presence of their enemies,” declares the LORD.
Context
7Aga m eji ihe e ji afụcha ọka fụchaa ha
nʼọnụ ụzọ ama nke ala ahụ.
Aga m eme ka mbibi bịakwasị ndị m, nke ga-eme ka ha gbara aka ụmụ,
nʼihi na ha esitebeghị nʼụzọ ọjọọ ha chigharịa. 8Aga m eme ka ọnụọgụgụ ụmụ nwanyị di ha nwụrụ baa ụba.
Ha ga-ehi nne karịa aja dị nʼọnụ oke osimiri.
Nʼetiti ehihie ka m ga-eme ka onye mbibi
bịakwasị ndị bụ nne ụmụ okorobịa ha;
na mberede ka m ga-eme ka nhụju anya
na ihe oke egwu bịakwasị ha. 9Nwanyị mụrụ ụmụ asaa ga-ada mba,
kubie ume.
Ọ ga-anwụ mgbe oge ya na-erubeghị,
ihere ga-eme ya; ọ ga-abụkwa onye e wedara nʼala.
Ma ndị fọdụrụ ndụ ka m ga-eme ka ha nwụọ
site na mma agha ndị iro ha.”
Otu a ka Onyenwe anyị kwubiri. 10Ahụhụ dịịrị m, nne m, na ị mụrụ m,
onye ya na ndị niile bi nʼala a na-alụ ọgụ, ma na-ese okwu.
O nwebeghị onye m binyere ego, ọ dịkwaghị onye binyere m ego,
ma mmadụ niile na-akọcha m. 11Onyenwe anyị kwuru sị,
“Nʼezie, aga m anapụta gị nʼihi ezi ihe,
aga m eme ka onye iro gị rịọ gị arịrịọ
nʼoge ihe ọjọọ na nʼoge mkpagbu.
Igbo text and audio: Biblica® Open Igbo Contemporary Bible™, made available under an open license by Biblica, Inc.