Jeremaya 15:8
Jeremiah 15:8 · Biblica® Open Igbo Contemporary Bible 2020
Aga m eme ka ọnụọgụgụ ụmụ nwanyị di ha nwụrụ baa ụba. Ha ga-ehi nne karịa aja dị nʼọnụ oke osimiri. Nʼetiti ehihie ka m ga-eme ka onye mbibi bịakwasị ndị bụ nne ụmụ okorobịa ha; na mberede ka m ga-eme ka nhụju anya na ihe oke egwu bịakwasị ha.
Jeremiah 15:8 in English
Jeremiah 15:8 · Berean Standard Bible
I will make their widows more numerous than the sand of the sea. I will bring a destroyer at noon against the mothers of young men. I will suddenly bring upon them anguish and dismay.
Context
6Gị onwe gị ajụla m,”
ka Onyenwe anyị kwupụtara.
“Ị nọgidela na-adaghachi azụ.
Ya mere, aga m ebikwasị gị aka, bibie gị.
Ike m ji akwụsị gị ka ị ghara ịdaghachi azụ agwụla m.* 7Aga m eji ihe e ji afụcha ọka fụchaa ha
nʼọnụ ụzọ ama nke ala ahụ.
Aga m eme ka mbibi bịakwasị ndị m, nke ga-eme ka ha gbara aka ụmụ,
nʼihi na ha esitebeghị nʼụzọ ọjọọ ha chigharịa. 8Aga m eme ka ọnụọgụgụ ụmụ nwanyị di ha nwụrụ baa ụba.
Ha ga-ehi nne karịa aja dị nʼọnụ oke osimiri.
Nʼetiti ehihie ka m ga-eme ka onye mbibi
bịakwasị ndị bụ nne ụmụ okorobịa ha;
na mberede ka m ga-eme ka nhụju anya
na ihe oke egwu bịakwasị ha. 9Nwanyị mụrụ ụmụ asaa ga-ada mba,
kubie ume.
Ọ ga-anwụ mgbe oge ya na-erubeghị,
ihere ga-eme ya; ọ ga-abụkwa onye e wedara nʼala.
Ma ndị fọdụrụ ndụ ka m ga-eme ka ha nwụọ
site na mma agha ndị iro ha.”
Otu a ka Onyenwe anyị kwubiri. 10Ahụhụ dịịrị m, nne m, na ị mụrụ m,
onye ya na ndị niile bi nʼala a na-alụ ọgụ, ma na-ese okwu.
O nwebeghị onye m binyere ego, ọ dịkwaghị onye binyere m ego,
ma mmadụ niile na-akọcha m.
Igbo text and audio: Biblica® Open Igbo Contemporary Bible™, made available under an open license by Biblica, Inc.