Native Bible

Jeremiah 15:10 · Biblica® Open Igbo Contemporary Bible 2020

Ahụhụ dịịrị m, nne m, na ị mụrụ m, onye ya na ndị niile bi nʼala a na-alụ ọgụ, ma na-ese okwu. O nwebeghị onye m binyere ego, ọ dịkwaghị onye binyere m ego, ma mmadụ niile na-akọcha m.

Jeremiah 15:10 in English

Jeremiah 15:10 · Berean Standard Bible

Woe to me, my mother, that you have borne me, a man of strife and conflict in all the land. I have neither lent nor borrowed, yet everyone curses me.

Context

8Aga m eme ka ọnụọgụgụ ụmụ nwanyị di ha nwụrụ baa ụba. Ha ga-ehi nne karịa aja dị nʼọnụ oke osimiri. Nʼetiti ehihie ka m ga-eme ka onye mbibi bịakwasị ndị bụ nne ụmụ okorobịa ha; na mberede ka m ga-eme ka nhụju anya na ihe oke egwu bịakwasị ha. 9Nwanyị mụrụ ụmụ asaa ga-ada mba, kubie ume. Ọ ga-anwụ mgbe oge ya na-erubeghị, ihere ga-eme ya; ọ ga-abụkwa onye e wedara nʼala. Ma ndị fọdụrụ ndụ ka m ga-eme ka ha nwụọ site na mma agha ndị iro ha.” Otu a ka Onyenwe anyị kwubiri. 10Ahụhụ dịịrị m, nne m, na ị mụrụ m, onye ya na ndị niile bi nʼala a na-alụ ọgụ, ma na-ese okwu. O nwebeghị onye m binyere ego, ọ dịkwaghị onye binyere m ego, ma mmadụ niile na-akọcha m. 11Onyenwe anyị kwuru sị, “Nʼezie, aga m anapụta gị nʼihi ezi ihe, aga m eme ka onye iro gị rịọ gị arịrịọ nʼoge ihe ọjọọ na nʼoge mkpagbu. 12“Mmadụ o nwere ike ịgbaji igwe, ya bụ igwe e si nʼakụkụ ugwu bubata, maọbụ bronz?

Igbo text and audio: Biblica® Open Igbo Contemporary Bible™, made available under an open license by Biblica, Inc.