Jeremaya 15:11
Jeremiah 15:11 · Biblica® Open Igbo Contemporary Bible 2020
Onyenwe anyị kwuru sị, “Nʼezie, aga m anapụta gị nʼihi ezi ihe, aga m eme ka onye iro gị rịọ gị arịrịọ nʼoge ihe ọjọọ na nʼoge mkpagbu.
Jeremiah 15:11 in English
Jeremiah 15:11 · Berean Standard Bible
The LORD said: “Surely I will deliver you for a good purpose; surely I will intercede with your enemy in your time of trouble, in your time of distress.
Context
9Nwanyị mụrụ ụmụ asaa ga-ada mba,
kubie ume.
Ọ ga-anwụ mgbe oge ya na-erubeghị,
ihere ga-eme ya; ọ ga-abụkwa onye e wedara nʼala.
Ma ndị fọdụrụ ndụ ka m ga-eme ka ha nwụọ
site na mma agha ndị iro ha.”
Otu a ka Onyenwe anyị kwubiri. 10Ahụhụ dịịrị m, nne m, na ị mụrụ m,
onye ya na ndị niile bi nʼala a na-alụ ọgụ, ma na-ese okwu.
O nwebeghị onye m binyere ego, ọ dịkwaghị onye binyere m ego,
ma mmadụ niile na-akọcha m. 11Onyenwe anyị kwuru sị,
“Nʼezie, aga m anapụta gị nʼihi ezi ihe,
aga m eme ka onye iro gị rịọ gị arịrịọ
nʼoge ihe ọjọọ na nʼoge mkpagbu. 12“Mmadụ o nwere ike ịgbaji igwe,
ya bụ igwe e si nʼakụkụ ugwu bubata, maọbụ bronz? 13“Aga m ewere ihe niile i nwere, ya na akụnụba gị,
nye ya onye ga-akwata ha nʼagha. Ọ gaghị akwụ gị ihe ọbụla.
Nʼihi na mmehie gị niile
ejupụtala nʼala a niile.
Igbo text and audio: Biblica® Open Igbo Contemporary Bible™, made available under an open license by Biblica, Inc.