Native Bible

Jeremiah 15:13 · Biblica® Open Igbo Contemporary Bible 2020

“Aga m ewere ihe niile i nwere, ya na akụnụba gị, nye ya onye ga-akwata ha nʼagha. Ọ gaghị akwụ gị ihe ọbụla. Nʼihi na mmehie gị niile ejupụtala nʼala a niile.

Jeremiah 15:13 in English

Jeremiah 15:13 · Berean Standard Bible

Your wealth and your treasures I will give up as plunder, without charge for all your sins within all your borders.

Context

11Onyenwe anyị kwuru sị, “Nʼezie, aga m anapụta gị nʼihi ezi ihe, aga m eme ka onye iro gị rịọ gị arịrịọ nʼoge ihe ọjọọ na nʼoge mkpagbu. 12“Mmadụ o nwere ike ịgbaji igwe, ya bụ igwe e si nʼakụkụ ugwu bubata, maọbụ bronz? 13“Aga m ewere ihe niile i nwere, ya na akụnụba gị, nye ya onye ga-akwata ha nʼagha. Ọ gaghị akwụ gị ihe ọbụla. Nʼihi na mmehie gị niile ejupụtala nʼala a niile. 14Aga m ewere gị nye ka ị bụrụ ohu ndị iro gị. Ị ga-ebi nʼala ị na-amaghị. Nʼihi na a ga-esite nʼiwe m mụnye ọkụ nke ga-eregbu gị.” 15Ị maara O Onyenwe anyị, ya mere cheta m, lekọtaakwa m. Bọọrọ m ọbọ megide ndị na-akpagbu m. Ewezugala m, biko, nʼihi na ị bụ onye ogologo ntachiobi. Lee ka m si na-anata nkọcha nʼihi na m na-asọpụrụ gị.

Igbo text and audio: Biblica® Open Igbo Contemporary Bible™, made available under an open license by Biblica, Inc.