Jeremaya 15:13
Jeremiah 15:13 · Biblica® Open Igbo Contemporary Bible 2020
“Aga m ewere ihe niile i nwere, ya na akụnụba gị, nye ya onye ga-akwata ha nʼagha. Ọ gaghị akwụ gị ihe ọbụla. Nʼihi na mmehie gị niile ejupụtala nʼala a niile.
Jeremiah 15:13 in English
Jeremiah 15:13 · Berean Standard Bible
Your wealth and your treasures I will give up as plunder, without charge for all your sins within all your borders.
Context
11Onyenwe anyị kwuru sị,
“Nʼezie, aga m anapụta gị nʼihi ezi ihe,
aga m eme ka onye iro gị rịọ gị arịrịọ
nʼoge ihe ọjọọ na nʼoge mkpagbu. 12“Mmadụ o nwere ike ịgbaji igwe,
ya bụ igwe e si nʼakụkụ ugwu bubata, maọbụ bronz? 13“Aga m ewere ihe niile i nwere, ya na akụnụba gị,
nye ya onye ga-akwata ha nʼagha. Ọ gaghị akwụ gị ihe ọbụla.
Nʼihi na mmehie gị niile
ejupụtala nʼala a niile. 14Aga m ewere gị nye ka ị bụrụ ohu ndị iro gị.
Ị ga-ebi nʼala ị na-amaghị.
Nʼihi na a ga-esite nʼiwe m mụnye ọkụ
nke ga-eregbu gị.” 15Ị maara O Onyenwe anyị,
ya mere cheta m, lekọtaakwa m.
Bọọrọ m ọbọ megide ndị na-akpagbu m.
Ewezugala m, biko, nʼihi na ị bụ onye ogologo ntachiobi.
Lee ka m si na-anata nkọcha nʼihi na m na-asọpụrụ gị.
Igbo text and audio: Biblica® Open Igbo Contemporary Bible™, made available under an open license by Biblica, Inc.