Jeremaya 15:14
Jeremiah 15:14 · Biblica® Open Igbo Contemporary Bible 2020
Aga m ewere gị nye ka ị bụrụ ohu ndị iro gị. Ị ga-ebi nʼala ị na-amaghị. Nʼihi na a ga-esite nʼiwe m mụnye ọkụ nke ga-eregbu gị.”
Jeremiah 15:14 in English
Jeremiah 15:14 · Berean Standard Bible
Then I will enslave you to your enemies in a land * you do not know, for My anger will kindle a fire that will burn against you.”
Context
12“Mmadụ o nwere ike ịgbaji igwe,
ya bụ igwe e si nʼakụkụ ugwu bubata, maọbụ bronz? 13“Aga m ewere ihe niile i nwere, ya na akụnụba gị,
nye ya onye ga-akwata ha nʼagha. Ọ gaghị akwụ gị ihe ọbụla.
Nʼihi na mmehie gị niile
ejupụtala nʼala a niile. 14Aga m ewere gị nye ka ị bụrụ ohu ndị iro gị.
Ị ga-ebi nʼala ị na-amaghị.
Nʼihi na a ga-esite nʼiwe m mụnye ọkụ
nke ga-eregbu gị.” 15Ị maara O Onyenwe anyị,
ya mere cheta m, lekọtaakwa m.
Bọọrọ m ọbọ megide ndị na-akpagbu m.
Ewezugala m, biko, nʼihi na ị bụ onye ogologo ntachiobi.
Lee ka m si na-anata nkọcha nʼihi na m na-asọpụrụ gị. 16Mgbe m chọpụtara okwu gị, eweere m ya rie dịka nri.
Ha tọrọ obi m ụtọ, bụrụkwa ihe na-enye m ọṅụ,
nʼihi na-akpọkwasịrị m aha gị,
Onyenwe anyị Chineke Onye pụrụ ime ihe niile.
Igbo text and audio: Biblica® Open Igbo Contemporary Bible™, made available under an open license by Biblica, Inc.