Native Bible

Jeremiah 15:16 · Biblica® Open Igbo Contemporary Bible 2020

Mgbe m chọpụtara okwu gị, eweere m ya rie dịka nri. Ha tọrọ obi m ụtọ, bụrụkwa ihe na-enye m ọṅụ, nʼihi na-akpọkwasịrị m aha gị, Onyenwe anyị Chineke Onye pụrụ ime ihe niile.

Jeremiah 15:16 in English

Jeremiah 15:16 · Berean Standard Bible

Your words were found, and I ate them. Your words became my joy and my heart’s delight. For I bear Your name, O LORD God of Hosts.

Context

14Aga m ewere gị nye ka ị bụrụ ohu ndị iro gị. Ị ga-ebi nʼala ị na-amaghị. Nʼihi na a ga-esite nʼiwe m mụnye ọkụ nke ga-eregbu gị.” 15Ị maara O Onyenwe anyị, ya mere cheta m, lekọtaakwa m. Bọọrọ m ọbọ megide ndị na-akpagbu m. Ewezugala m, biko, nʼihi na ị bụ onye ogologo ntachiobi. Lee ka m si na-anata nkọcha nʼihi na m na-asọpụrụ gị. 16Mgbe m chọpụtara okwu gị, eweere m ya rie dịka nri. Ha tọrọ obi m ụtọ, bụrụkwa ihe na-enye m ọṅụ, nʼihi na-akpọkwasịrị m aha gị, Onyenwe anyị Chineke Onye pụrụ ime ihe niile. 17O nwebeghị oge mụ na ndị na-achị ọchị nke ukwuu ji nọkọọ. Esokwaghị m ha ṅụrịkọọ ọṅụ. A nọdụụrụ m onwe m nʼihi na aka gị dịkwasịrị m. I mekwara ka iwe jupụta m nʼobi nʼihi ajọ omume ha. 18Gịnị mere ihe mgbu m adịghị akwụsị akwụsị? Gịnị mekwara ọnya m ji dị njọ na-apụghị ịgwọta ya? Ị dịrị m dịka mmiri iyi na-arafu mmadụ, dịka isi iyi nke na-ekwesighị ntụkwasị obi.

Igbo text and audio: Biblica® Open Igbo Contemporary Bible™, made available under an open license by Biblica, Inc.