Jeremaya 15:16
Jeremiah 15:16 · Biblica® Open Igbo Contemporary Bible 2020
Mgbe m chọpụtara okwu gị, eweere m ya rie dịka nri. Ha tọrọ obi m ụtọ, bụrụkwa ihe na-enye m ọṅụ, nʼihi na-akpọkwasịrị m aha gị, Onyenwe anyị Chineke Onye pụrụ ime ihe niile.
Jeremiah 15:16 in English
Jeremiah 15:16 · Berean Standard Bible
Your words were found, and I ate them. Your words became my joy and my heart’s delight. For I bear Your name, O LORD God of Hosts.
Context
14Aga m ewere gị nye ka ị bụrụ ohu ndị iro gị.
Ị ga-ebi nʼala ị na-amaghị.
Nʼihi na a ga-esite nʼiwe m mụnye ọkụ
nke ga-eregbu gị.” 15Ị maara O Onyenwe anyị,
ya mere cheta m, lekọtaakwa m.
Bọọrọ m ọbọ megide ndị na-akpagbu m.
Ewezugala m, biko, nʼihi na ị bụ onye ogologo ntachiobi.
Lee ka m si na-anata nkọcha nʼihi na m na-asọpụrụ gị. 16Mgbe m chọpụtara okwu gị, eweere m ya rie dịka nri.
Ha tọrọ obi m ụtọ, bụrụkwa ihe na-enye m ọṅụ,
nʼihi na-akpọkwasịrị m aha gị,
Onyenwe anyị Chineke Onye pụrụ ime ihe niile. 17O nwebeghị oge mụ na ndị na-achị ọchị nke ukwuu ji nọkọọ.
Esokwaghị m ha ṅụrịkọọ ọṅụ.
A nọdụụrụ m onwe m nʼihi na aka gị dịkwasịrị m.
I mekwara ka iwe jupụta m nʼobi nʼihi ajọ omume ha. 18Gịnị mere ihe mgbu m adịghị akwụsị akwụsị?
Gịnị mekwara ọnya m ji dị njọ na-apụghị ịgwọta ya?
Ị dịrị m dịka mmiri iyi na-arafu mmadụ,
dịka isi iyi nke na-ekwesighị ntụkwasị obi.
Igbo text and audio: Biblica® Open Igbo Contemporary Bible™, made available under an open license by Biblica, Inc.